Jiri Akwụkwọ Anyị Na-eme Ihe Bara Uru
1. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ekele maka ihe Jehova na-enye anyị otú ahụ Jizọs mere?
1 Mgbe Jizọs jichara ụzọ ọrụ ebube nyejuo ìgwè mmadụ afọ, ọ hụrụ na a tụtụkọtara nri ndị fọrọ afọ. (Mat. 14:19-21) Ebe ọ bụ na Jizọs ekweghị ka nri ahụ Jehova nyere fuo ọhịa, ọ kụziiri anyị na anyị kwesịrị ‘inwe ekele’ maka ihe niile Jehova si n’aka “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi” na-enye anyị, ma jiri ha mee ihe bara uru.—Kọl. 3:15; Luk 12:42; Mat. 24:45-47.
2. Olee ihe anyị ga-eme ka magazin ghara ịna-eju n’akpa anyị?
2 Magazin: Ọ bụrụ na anyị anaghị enyefe ndị mmadụ magazin, ha ga-eju n’akpa anyị. Ọ bụrụ na magazin na-ejukarị n’akpa anyị, anyị kwesịrị iselatatụ aka na magazin ole anyị na-anara. Oleekwanụ maka magazin ndị ochie? N’agbanyeghị na ha emeela ochie, ihe ndị e dere n’ime ha ka bara uru. Ọ bụrụ na anyị nwere ọtụtụ magazin merela ochie, anyị nwere ike zi ha onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ ka ọ gwa anyị ụzọ ndị dị mma anyị ga-esi enyefe ha ndị mmadụ.
3, 4. Olee ihe ndị anyị ga-eburu n’obi ma anyị narawa akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
3 Akwụkwọ Ndị Ọzọ: Ọ bụrụ na a gbanwee akwụkwọ a ga-eji aga ozi n’ọnwa, buru ụzọ lee n’ụlọ gị ma i nwere ya tupu ị nara ọzọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Hụ na ole ị naara bụ ole ị ga-enyeli n’izu, gaakwa nara ọzọ ma i nyechaa ndị nke ahụ.
4 A bịa n’akwụkwọ ndị nke gị, were naanị ndị dị gị ezigbo mkpa. Dee aha gị na aha ọgbakọ gị n’ebe e nyere ohere ka e dee ya n’akwụkwọ ahụ. Ọ ga-eme ka e nwee ike weghachiri gị ya ma o funahụ gị. Ọ bụrụ na i nwere Watchtower Library dị na CD-ROM, ya bụrụkwa na i doziri magazin ị na-agụ agụ edozi, o nwere ike ọ gaghị adịcha mkpa ka ị tụwa ọda mpịakọta Ụlọ Nche na Teta!
5. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ anyị?
5 Inye Ndị Mmadụ Akwụkwọ Anyị: Ndị anyị na-enye akwụkwọ anyị bụ naanị ndị nwere ezigbo mmasị. Ka anyị buru n’obi na ọ bụ anyịnwa ka ọ dị n’isi inye onyinye maka ego emefuru bie akwụkwọ ndị a bara uru anyị ji aga ozi. I nye ndị nwere mmasị akwụkwọ anyị, ahapụla ịgwa ha na ha nwere ike inye onyinye iji kwadoo ọrụ zuru ụwa ọnụ anyị na-arụ.
6. Olee ihe mere anyị anaghị eji akwụkwọ anyị egwuri egwu, oleekwa ihe nke ahụ ga-eme ka anyị jiri ha mee?
6 Jizọs ji ụzọ ọrụ ebube nye ndị mmadụ nri. Ma, ọtụtụ mgbe, o nyere ha nri ime mmụọ. Jizọs sịrị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Mat. 4:4) Akwụkwọ anyị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu bara uru dị na Baịbụl, bụ́ ndị ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Anyị ekwesịtụghị inye ha ndị na-agaghị eji ha kpọrọ ihe!