Nleta nke Pụrụ Ịbụ Ngọzi
1 Ọ bụ ọṅụ ka Zakịọs ji nabata Jisọs dị ka onye ọbịa n’ụlọ ya. Leekwa ngọzi nleta ahụ mesịrị ghọọ!—Luk 19:2-9.
2 Taa, dị ka Isi nke ọgbakọ ya, Jisọs Kraịst na-eduzi ndị okenye ‘ịzụ ìgwè atụrụ nta Chineke.’ (1 Pita 5:2, 3; Jọn 21:15-17) Tụkwasị n’izi ihe ná nzukọ na ibute ụzọ n’ozi ubi, ndị nlekọta ọgbakọ na-eji ịhụnanya enyere ndị òtù ọgbakọ aka n’otu n’otu. Ya mere, site n’oge ruo n’oge, ị pụrụ ịtụ anya inweta nlebara anya onwe onye site n’aka ndị okenye, n’ebe obibi gị, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mgbe a na-ejekọ ozi ubi, ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ. Ì kwesịrị ịdị na-atụ nleta ndị okenye ụjọ? Ọ dịghị ma ọlị. Ha ịkpọtụrụ gị apụtaghị na ị na-emehie ihe n’ụzọ ụfọdụ. Mgbe ahụ, gịnị bụ nzube nke nleta ọzụzụ atụrụ?
3 Pọl kwuru na ya chọrọ ileta ụmụnna ya ‘iji wee lee otú ha na-eme.’ (Ọrụ 15:36) Ee, dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, ndị okenye nwere nnọọ mmasị ịma otú ị na-eme. Ha chọrọ inyere gị aka n’ụzọ ime mmụọ bụ́ nke pụrụ inyere gị aka ma wulie gị elu. Nlekọta onwe onye dị otú ahụ bụ ihe Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị na-ahụ n’anya bụ́ Jehova chọrọ ka onye ọ bụla n’ime anyị nweta.—Ezik. 34:11.
4 Nabata Nleta Ndị Okenye: Nzube Pọl n’ileta ụmụnna ya bụ iji ‘wee mee ka ha keta onyinye amara ụfọdụ nke Mmụọ Nsọ, ka e wee mee ka ha guzosie ike; nakwa ka e wee kasie ha na ya obi.’ (Rom 1:11, 12) Ọ dị anyị nile mkpa inweta agbamume ime mmụọ na mgbe ikpeazụ a siri ike, enyemaka dịkwa anyị mkpa iji nọgidesie ike n’okwukwe. N’enweghị obi abụọ, mmeghachi omume gị dị mma n’ebe nleta ọzụzụ atụrụ dị ga-eme ka e nwee mgbarịta ume dị mma.
5 Nwee ekele maka ọtụtụ abamuru a ga-enweta site n’ọrụ ọzụzụ atụrụ nke ndị okenye. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ma ọ bụ ajụjụ na-echegbu gị, cheta na ndị okenye nọ n’ọgbakọ inyere gị aka. Alala azụ iso ha kwurịta ihe ọ bụla pụrụ ịdị na-emetụta ọnọdụ ime mmụọ gị. Nwee ekele maka ndokwa ịhụnanya a nke Jehova mere, ṅụrịakwa ọṅụ ná ngọzi nke nleta dị otú ahụ pụrụ iweta.