Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
1 “Ịhụ unu anya na-agụsi m ike . . . Ọ dị m ọkụ n’obi izikwa unu . . . ozi ọma.” Otú a ka Pọl onyeozi kwuru ná mmalite nke akwụkwọ ozi o degaara ụmụnna nọ na Rom. N’ihi gịnị ka o ji na-anụ Pọl ọkụ n’obi ileta ha? O kwuru, sị: “Ka m wee nweekwa mkpụrụ ụfọdụ n’etiti unu . . . N’ihi na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m: n’ihi na ọ bụ ike nke Chineke ruo nzọpụta.”—Rom 1:11-16.
2 Pọl gosipụtara otu ịnụ ọkụ n’obi a n’ịgwa ndị okenye nke Efesọs okwu. O chetaara ha, sị: “Site n’ụbọchị mbụ m zọrọ ụkwụ n’Esia, . . . otú egwu na-emeghị m ka m ghara . . . izi unu ihe n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka unu kwa n’otu n’otu, na-agwasi unu ike, ma ndị Juu ma ndị Grik.” (Ọrụ 20:18-21) N’ókèala nile e kenyere ya, Pọl zubere ịgbasa ozi ọma nke nzọpụta na inweta mkpụrụ Alaeze. Lee mmụọ magburu onwe ya kwesịrị nṅomi nke ahụ bụ!
3 Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị: ‘Àna m egosipụta otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ n’ịkpọsa ozi ọma n’ógbè m? Kama ile ọrụ ime nkwusa anya dị ka ọrụ efu, àna m anụ ọkụ n’obi isoro ọtụtụ mmadụ dị ka ọ pụrụ ikwe mee kerịta ozi ọma ahụ? Èjiriwo m ekpere tụlee ọnọdụ m? Àchọpụtawo m ohere ndị e nwere n’ókèala anyị, dị ka ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, n’okporo ámá, ebe achụmnta ego, site na telifon, nakwa n’ụzọ mberede?’
4 Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Kere Òkè n’April: Ọnwa April bụ oge dị mma ịgbasawanye òkè anyị na-ekere n’ọrụ nkwusa. Mbelata e belatara awa ole a chọrọ kwesịrị ime ka o kwe ọtụtụ ndị mee ịsụ ụzọ inyeaka. Ikekwe ọnọdụ gị ga-ekwe ka i jee ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April na May. Ma ọ bụ ị pụrụ idenye aha dị ka ọsụ ụzọ oge nile n’ihi mgbanwe e mere n’awa ole a chọrọ. Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa ọgbakọ, ị̀ pụrụ itinyekwu oge karịa otú ị na-emebu n’ozi n’ọnwa a na nke na-esonụ, na-enyere ndị ahụ nwere ike ịsụ ụzọ aka? Nke ahụ ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa!
5 Dị ka Pọl, ndị nkwusa Alaeze kwesịrị ịnọgide na-egosipụta ịnụ ọkụ n’obi site n’iwepụta onwe ha n’ọrụ nkwusa. Ime ihe nile anyị pụrụ ime n’ozi ga-ewetara anyị ezi ọṅụ. Pọl nwere ọṅụ dị otú a n’ozi ya dị nsọ. Anyị ga-eme nke ọma iṅomi ihe nlereanya ya magburu onwe ya.—Rom 11:13; 1 Kọr. 4:16.