Ụzọ Ndị Òtù Ezinụlọ Si Emekọ Ihe Ọnụ Iji Kere Òkè Zuru Ezu—n’Ozi
1 Gịnị pụrụ inye obi ụtọ karịa ịhụ ndị di na nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka ka ha na-ejekọ ozi ndị Kraịst ọnụ, na-eto aha Jehova n’ihu ọha? (Abụ Ọma 148:12, 13) Ezinụlọ nile kwesịrị inwe ezi ndokwa maka ikere òkè chiri anya n’ozi ubi. Ezinụlọ gị ò nwere otu ụbọchị n’izu o setịpụrụ iji jee ozi? Ya bụrụ otú ahụ, onye ọ bụla ga-amazi kpọmkwem ihe ọ ga-eme atụmatụ ya ma nwee ike ikere òkè zuru ezu.—Ilu 21:5a.
2 Tupu ụbọchị ezinụlọ unu ga-eje ozi eruo, gịnị ma unu jikọta aka ọnụ kwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke ezinụlọ unu ga-eji eme ihe? Nnọkọ mmụgharị ihe pụrụ ịkasi nye aka, ha pụkwara ime ka e nwee ezi mmụọ nke imekọ ihe ọnụ n’ezinụlọ. Lee ihe na-eweta ụgwọ ọrụ ọ bụ mgbe ozi ubi bụ ihe omume ezinụlọ, ndị òtù ezinụlọ nile akwadebekwa nke ọma!
3 Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị sonyeere otu ezinụlọ n’ọrụ magazin. Mgbe ya na otu n’ime ụmụ ha ndị nwanyị so na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ, nwata nwanyị ahụ jụrụ, sị: “Ruo ogologo oge hà aṅaa ka mụ na gị ga-arụru?” Ọ kọwaziri na ya na nna ya ga-esokwa rụọ. Ọ pụtara ìhè na ijekọ ozi ọnụ tọrọ ya na nna ya ụtọ n’ezie. Lee ezi mmụọ ezinụlọ ọ bụ!
4 Ụfọdụ ezinụlọ nwere ike ịrụkọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ọnụ n’otu ọnwa n’afọ. Ma ọ bụ ọ dịkarịa ala ọ pụrụ ikwe otu onye n’ezinụlọ omume ije ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka n’akwụsịghị akwụsị ma ọ bụ debanye aha ya dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Site n’inwe ezi nhazi na nkwado, ikekwe ndị nile nọ n’ezinụlọ ga-enwe ike ịmụbawanye òkè ha na-ekere n’ozi site n’ịkwado onye nke na-asụ ụzọ. Ezinụlọ ahụ ga-enwetarịrị ngọzi site n’ọrụ a ka ukwuu na site n’ezi ahụmahụ ndị a na-enweta n’ozi.—Mal. 3:10.
5 Ikere òkè zuru ezu n’ọrụ izisa ozi ọma ga-enye aka ime ka ezinụlọ kpachie anya, nwee ịnụ ọkụ n’obi, mịa mkpụrụ ma nwee obi ụtọ n’ozi Jehova!—Tulee Ndị Filipaị 2:1, 2.