Mee Atụmatụ Tupu Oge Eruo!
1 Nzukọ Jehova na-ewepụta usoro ihe omume ọchịchị Chineke oge nile bụ́ ndị a kwadebere iji gboo mkpa ime mmụọ anyị nile. Obi ekele na-akpali anyị iji ihe ọ bụla e dokwara mee ihe n’ụzọ zuru ezu, dị ka nleta nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, mgbakọ dị iche iche, na ihe omume ndị ọzọ pụrụ iche e mere atụmatụ ha n’ọgbakọ. (Mat. 5:3) Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ndokwa ndị a na-akwa ụfọdụ n’ihi atụmatụ ndị ọzọ ha meworo. Gịnị ka a pụrụ ime iji gbochie nke a? Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ihe ndị na-abụghị ihe omume ọchịchị Chineke agaghị egbochi “ihe ndị ka mkpa”?—Fil. 1:10, NW.
2 Iji Amamihe Mee Atụmatụ Dị Oké Mkpa: Ilu 21:5 na-adụ ọdụ, sị: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru: ma echiche nile nke onye ọ bụla nke na-eme ngwa na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.” Iji nweta “uru” ime mmụọ ahụ, ọ dị mkpa ka anyị dị nkọ n’ime atụmatụ tupu oge eruo, na-eburu n’uche ihe omume ọchịchị Chineke ndị e meworo atụmatụ ha. Anyị kwesịrị itinye ihe omume anyị n’oge ha na-agaghị egbochi anyị ịnọ ya iji nweta ngọzi ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị emee atụmatụ ihe ndị anyị chọrọ ime ngwa ngwa, n’echeghị echiche banyere ihe omume ọchịchị Chineke ndị na-abịanụ, o yiri ka anyị ga-anọ “n’ikọ ụkọ” ime mmụọ.
3 Agụpụla Onwe Gị! Anyị nile na-eme atụmatụ maka ọdịnihu, gụnyere maka ezumike, njem achụmnta ego, ije leta ndị ikwu, na ihe ndị ọzọ. Tupu i kwe nkwa ma ọ bụ kwubie ihe ị ga-eme, lee usoro ihe omume ime mmụọ ndị na-abịanụ. Ọ bụrụ na ị chọpụta na onye nlekọta sekit na-abịa ma ọ bụ na e mere ndokwa maka mgbakọ n’otu oge ahụ ị pụrụ ime njem, gbalịsie ike iyigharị ihe omume gị ka i wee nwee ike ikere òkè. A na-agwa anyị n’ezi oge banyere ihe omume ndị gbara ọkpụrụkpụ e mere ndokwa ha maka ọdịnihu. Ndị okenye nọ n’ọgbakọ gị pụrụ ịgwa gị ihe e meworo atụmatụ ya n’ọgbakọ unu.
4 Site n’ilepụ anya n’ihu n’ime atụmatụ tupu oge eruo maka ihe ndị ka mkpa, anyị ga-abụ ndị ‘jupụtara ná mkpụrụ nke ezi omume, ka Chineke wee nwee ebube na otuto.’—Fil. 1:11.