Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/99 p. 1
  • Ị̀ Na-ahụ Nanị Ọdịdị Elu Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-ahụ Nanị Ọdịdị Elu Ahụ?
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Ga-azọpụta Ụdị Mmadụ Nile
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ejila Otú Mmadụ Dị Ekpebi Otú Ị Ga-esi Ewere Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ọ “Na-ahụ Ihe Dị n’Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Na-eṅomi Ikpe Ziri Ezi nke Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 6/99 p. 1

Ị̀ Na-ahụ Nanị Ọdịdị Elu Ahụ?

1 Ka anyị na-eje ozi ihu ọha anyị, ihe mbụ anyị hụrụ banyere ụfọdụ ndị pụrụ ime ka anyị latụ azụ izi ha ozi ọma. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwoke na-atụ ụjọ n’ile anya na-ele gị anya ọjọọ mgbe nile ị na-akpọtụrụ onye agbata obi ya gosiworo mmasị n’eziokwu ahụ? Otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ nke a mere kpebiri ịgakwuru nwoke ahụ ma gwa ya okwu. O kelere nwanna nwanyị ahụ n’ụzọ na-adịghị mma. Ma, n’ụzọ na-eju anya, o ji mmasị gee ntị n’ozi Bible ma kweta ịmụ ihe. N’ihi na nwanna nwanyị ahụ emeghị mkpebi dabeere n’ọdịdị elu ahụ, e megheere nwoke a na nwunye ya ụzọ ịmụta eziokwu ahụ.

2 Nwanna nwanyị ọzọ tụrụ ụjọ ná mmalite n’ihi ọdịdị elu ahụ nke otu nwa okorobịa nwere ogologo ntutu ma ọ nọgidere na-agbara ya àmà ná mkpirikpi mgbe ọ bụla nwa okorobịa ahụ batara n’ụlọ ahịa ebe nwanna nwanyị ahụ na-arụ ọrụ. Mgbalị ya rụpụtara ihe, nwa okorobịa ahụ bụ Onyeàmà e mere baptism ugbu a. Gịnị ga-eme ka anyị ghara ikwubi ngwa ngwa na ndị dị otú ahụ agaghị ege ntị?

3 Iṅomi Ihe Nlereanya Jisọs: Jisọs maara na ya ga-enye ndụ ya maka onye ọ bụla. N’ihi ya, ọdịdị a na-ahụ anya nke ndị ọzọ egbochighị ya. Ọ ghọtara na ọbụna ndị nwere aha ọjọọ pụrụ ịdị njikere ịgbanwe ma e nye ha ihe nkwali na enyemaka kwesịrị ekwesị. (Mat. 9:9-13) Ọ gbalịrị inyere ma ndị bara ọgaranya ma ndị ogbenye aka. (Mat. 11:5; Mak 10:17-22) Ka anyị ghara iji ọdịdị elu ahụ nke ndị anyị na-ezute n’ozi kpebie ụdị ndị ha bụ, na-emechi anya anyị n’ihe pụrụ ịbụ ọnọdụ obi dị mma. (Mat. 7:1; Jọn 7:24) Gịnị pụrụ inyere anyị aka iṅomi ihe nlereanya magburu onwe ya nke Jisọs?

4 Site n’ọmụmụ anyị na-amụ Bible, anyị aghọtawo na Okwu Chineke nwere ikike ịgbanwe echiche, àgwà, na ụdị onye mmadụ bụ. (Efe. 4:22-24; Hib. 4:12) Ya mere, anyị kwesịrị ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi ma hapụrụ Jehova, bụ́ Onye na-enyocha obi mmadụ, ihe fọdụziri.—1 Sam. 16:7; Ọrụ 10:34, 35.

5 Ka anyị iso ụdị mmadụ nile kerịta ozi ọma ahụ n’eleghị mmadụ anya n’ihu, n’agbanyeghị ọdịdị elu ahụ ha, tụnye ụtụ n’oké ọrụ owuwe ihe ubi ahụ na mgbe ikpeazụ ndị a.—1 Tim. 2:3, 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya