Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/00 p. 1
  • Okwu Amụma Nile nke Chineke Ga-emezu!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwu Amụma Nile nke Chineke Ga-emezu!
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọtụtụ Nde Ga-aga—Ị̀ Ga-aga?
    Teta!—1999
  • Okwu Amụma nke Chineke Na-enye Olileanya Maka Ọdịnihu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Nwee Okwukwe n’Okwu Amụma Chineke!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998-1999 Dị Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 2/00 p. 1

Okwu Amụma Nile nke Chineke Ga-emezu!

1 Ndịàmà Jehova na-enwe mmasị mgbe nile n’amụma Bible. Ya mere anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu ịnụ na isiokwu nke mgbakọ distrikti nke afọ 1999/2000 ga-abụ “Okwu Amụma nke Chineke.” Ọ dị anyị ọkụ n’obi ịmata ihe Jehova kwadebeere anyị dị ka “[nri bịara] n’oge ya.” (Mat. 24:25) O mechughị anyị ihu.

2 Isi Ihe Ndị E Mere ná Mgbakọ: Okwu bụ́ isi e kwuru na Friday nke bụ́, “Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke,” gụnyere ntụle na-enye ihe ọmụma nke ihe ndekọ banyere mwogha ahụ. (Mat. 17:1-9) O mesiri ya ike na anyị na-akwado ịbanye ugbu a kpọmkwem n’oge kasị mma n’ihi na anyị abamiela abamie n’oge ọgwụgwụ, usoro ihe ọhụrụ dịkwa nnọọ nso! Otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi ṅaa ntị n’Okwu Chineke bụ site n’ịdị na-agụchi ya anya. Usoro isiokwu bụ́ “Ka Ịgụ Okwu Chineke Na-atọ Gị Ụtọ” tụrụ aro ndị bara uru iji mee ka ọgụgụ Bible anyị bakwuo uru ma dị ụtọ karị.

3 N’ehihie Saturday anyị tụlere ihe ndị mere anyị kwesịrị iji kwenye na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ. Ị̀ pụrụ icheta ihe ndị a nile? N’ụtụtụ Sunday, amụma Habakuk bịara nwee mmetụta ka ukwuu mgbe anyị nụrụ na oge anyị yiri nnọọ oge nke ya nakwa na ihe ndị dị ịrịba ama ga-eme n’isi nso mgbe Jehova ga-ebibi ndị ajọ mmadụ ma zọpụta ndị ezi omume. Ị̀ ghọtara isi ihe dị n’ihe nkiri ahụ dabeere na Bible banyere Jekọb na Ịsọ? Anyị aghaghị ịchụsosi ngọzi ndị sitere n’aka Jehova ike, na-eguzogide mmụọ enweghị mmasị na nke ọ gbasara m.

4 Akwụkwọ Ọhụrụ Na-akpali Mmasị: Lee ka anyị si nwee obi ụtọ inweta akwụkwọ ọhụrụ bụ́, Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị gụwalarị akwụkwọ a na-adọrọ mmasị. Ọkà okwu wepụtara ya kwuru, sị: “E wezụga isi ihe ole na ole, e mezuwo amụma nile dị n’akwụkwọ Daniel.” Nke ahụ ọ̀ dịghị emesi ịdị ngwa nke oge anyị ike?

5 Usoro ihe omume mgbakọ ahụ emewo ka nkwenye anyị nwere, na nkwa nile nke Chineke ndị na-emezubeghị ga-emezu, siwanye ike. A na-akpali anyị ịnọgide na-akọrọ ndị ọzọ okwu amụma Chineke!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya