‘Ndị A Nwaleworo’—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
1 N’ihi uto na-aga n’ihu ná nzukọ Jehova, ọ dị mkpa site n’oge ruo n’oge ka ụmụnna nwoke ruru eru na-eje ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi. Ọtụtụ ụmụnna nwoke ndị a na-ahọpụtabeghị, gụnyere ndị nọ n’afọ iri na ụma, nwere ọchịchọ ije ozi n’ọgbakọ. Mgbe e nyekwuru ha ọrụ, ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị bara uru, bụrụkwa ndị nwere afọ ojuju. Ịgakwu n’ihu ha dabeere na ha ịbụ ndị ‘a nwalere.’ (1 Tim. 3:10, NW) Olee otú e si emezu nke a?
2 Ọrụ Ndị Okenye: Dị ka akụkụ nke iji ihe ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka ndị ohu na-eje ozi dị na 1 Timoti 3:8–13 tụlee iru eru nke nwanna nwoke, ndị okenye ga-anwale nwanna nwoke iji mara ma ọ ga-ebuli ibu ọrụ. Ha pụrụ ikenye ya ije ozi ndị bara uru bụ́ ndị metụtara inye ụmụnna magazin, ilekọta ígwè okwu, ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, na ihe ndị ọzọ. Ndị okenye ga-achọpụtakwa otú o si anakwere ma na-elekọta ọrụ ya. Ha ga-ele anya ịchọpụta àgwà nke ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi, ime ihe n’oge, ịdị uchu, obi umeala, mmụọ afọ ofufo, na ikike o nwere isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe nke ọma. (Fil. 2:20) Ọ̀ na-egosi ezi ihe nlereanya n’ihe banyere uwe na ejiji ya? Ọ̀ na-eji ibu ọrụ akpọrọ ihe? Ha na-achọ ka o “site n’ibi obi ọma ya gosi ọrụ ya nile n’ime ịdị nwayọọ nke amamihe.” (Jes. 3:13) Ọ̀ na-ewepụta onwe ya n’ezie inye aka n’ọgbakọ? Ọ̀ na-edebe iwu ahụ Jisọs nyere bụ́ ‘ime ndị na-eso ụzọ’ site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ozi ubi?—Mat. 28:19; lee Ụlọ Nche nke September 1, 1990, peji nke 18-28.
3 Ọ bụ ezie na ọ dịghị afọ ndụ Bible kwuru na mmadụ ga-erurịrị tupu a họpụta ya dị ka ohu na-eje ozi, ọ na-ezo aka n’ebe ụmụnna nwoke dị otú ahụ nọ dị ka “[ndị ikom na-eje ozi, NW].” O nweghị ihe ga-eme ka anyị chee na ha ga-abụ ndị nọ ná mmalite ma ọ bụ n’etiti afọ iri na ụma, karịsịa ebe e kwuru na ha nwere ike bụrụ ndị lụrụ nwanyị ma mụọ ụmụ. (1 Tim. 3:12, 13) Ndị ikom dị otú ahụ ekwesịghị ikwe ka “agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa” merie ha kama ha kwesịrị ịbụ ndị na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na-enwe ezi aha na akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke na mmadụ.—2 Tim. 2:22.
4 Ọ bụ ezie na ikike e bu pụta ụwa bara uru, àgwà na mmụọ mmadụ bụ ihe ndị dị mkpa n’ezie. Nwanna nwoke ò ji obi umeala na-achọ ito Chineke na ijere ụmụnna ya ozi? Ọ bụrụ otú ahụ, Jehova ga-agọzi mgbalị ọ na-etinye inwe ọganihu n’ọgbakọ.