Ka Anyị Nile Sọpụrụ Jehova na Ọkpara Ya
Otú Ndị Nile Ga-aga Ememe Ncheta n’April 8 Pụrụ Isi Rite Uru Zuru Ezu Karị
1 Ole ndị taa ka a na-enye nsọpụrụ pụrụ iche? Ọ bụ ndị ụwa ji ihe ndị ha rụzuru kpọrọ ihe nke ukwuu. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe a na-echefu ihe ndị ha mere n’oge na-adịghị anya. Ma gịnị banyere ọrụ ndị na-abara ihe nile a kpọrọ mmadụ uru n’ezie? Anyị ga-echebasiri ndị kasị ukwuu n’ime ha echiche ike ka anyị na-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị mgbe anyanwụ dasịrị n’April 8, 2001.
2 Ònye kwesịrị inweta nsọpụrụ kasịnụ? Bible na-aza, sị: “Gị, Onyenwe anyị . . . I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpu. 4:11) Dị ka Onye Okike, Jehova bụ Eze Na-achị Isi nke eluigwe na ala. Oruru o ruuru ya inweta nsọpụrụ agaghị akwụsị ma ọlị!—1 Tim. 1:17.
3 Jisọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, mere ihe ndị dị mkpa bụ́ ndị ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi na-adịghị agwụ agwụ. O ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè. (Jọn 5:19) Nrubeisi zuru ezu nke o gosipụtara na ozi o ji ikwesị ntụkwasị obi jee mere ka o ‘kwesị ịnata ike nile, na akụ̀, na amamihe, na ume, na nsọpụrụ, na otuto, na ngọzi.’ (Mkpu. 5:12) Nna ya kwanyeere ya ùgwù site n’ichi ya Eze. (Abụ Ọma 2:6-8) Nye anyị, anyị ga-enwe ohere ịsọpụrụ ma Nna ma Ọkpara ahụ ka anyị na-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’April 8, 2001.
4 N’ụzọ dị mwute, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nyeworo Jehova na Ọkpara ya nsọpụrụ kwesịịrị ha. Mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị Israel, jeere Jehova ozi nanị iji mezuo iwu. Nke a bụ nnọọ enweghị nkwanye ùgwù. (Mal. 1:6) Nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị chọrọ iji ikwesị ntụkwasị obi na-erube isi, na-adabere n’ịhụnanya na ekele anyị nwere maka ihe nile Jehova na Ọkpara ya mewooro anyị. Inye nsọpụrụ na nkwanye ùgwù dị otú ahụ na-apụta na anyị na-egosipụta egwu na nsọpụrụ Chineke, na-anakwere Jehova na Jisọs n’ụzọ anyị nile. Ọgbakọ ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịkụziri ndị ọzọ ime otu ihe ahụ na inyere ha aka ime otú ahụ.
5 Oge Pụrụ Iche Iji Gosi Nsọpụrụ: Ememe Ncheta bụ nnọkọ kasị mkpa nke ndị Jehova na-enwe kwa afọ. Onye ọ bụla nwere ọchịchọ nke ijere Jehova ozi na ịsọpụrụ ya kwesịrị ịnọ na ya. (Luk 22:19) Anyị na-atụ anya na tụkwasị na nde Ndịàmà 6 na-ejechi ozi anya, ndị nwere mmasị ga-eme ka ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịanụ mụbaa karịa nde 14. Lee ohere mara mma ọ bụ iji sọpụrụ Nna anyị nke eluigwe! Ọ bụ ezie na ememe ahụ na-elekwasị anya n’ebe Jisọs nọ, nsọpụrụ na nkwanye ùgwù a na-egosipụta maka ihe ọ rụzuru na-enye Nna ahụ, bụ́ onye zitere ya, otuto.—Jọn 5:23.
6 Gịnị ka anyị pụrụ ime iji kwado ememe a pụrụ iche? Anyị pụrụ inyere ndị ọhụrụ nwere mmasị aka irite uru zuru ezu. Gbaa ha ume ịga, n’ebe ọ dịkwa mkpa, jiri obiọma nyere ha aka irute ebe ahụ. Kọwaa nzube nke okwu a ga-ekwu. Mee ka ha na ndị ọzọ mata. Ihe ha hụrụ na nke ha nụrụ pụrụ ịkpali ha ịchọ isonyere anyị n’ịsọpụrụ Jehova.
7 Eledala mmetụta nke usoro ihe omume ahụ pụrụ inwe anya. Otu nwa akwụkwọ mahadum si otú a meghachi omume: “Agawo m Oriri Nsọ ọtụtụ mgbe na chọọchị m, ma nke a dị nnọọ iche. Ahụrụ m na nke a bụ nnọọ ihe Bible kwuru, echekwara m na unu nwere eziokwu ahụ.” Ọ malitere ịgachi nzukọ anya, e mekwara ya baptism n’oge na-adịghị anya.
8 Nyere Ndị Ọhụrụ Aka Inwe Ọganihu: Rịba ndị ọhụrụ bịara Ememe Ncheta ahụ ama ma leta ha ngwa ngwa e mesịrị iji tụleghachi ihe ndị na-enye ume ọhụrụ ha mụtara na ndị ha hụrụ. Mee ka ha mara banyere nzukọ ndị ọzọ, bụ́ ebe ha ga-amụba ihe ọmụma Bible ha nwere. Ntụle nke isi 17 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma, nke bụ́ “Chọta Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Etiti Ndị Chineke,” ga-egosi ha ọtụtụ ndokwa ime mmụọ nke ọgbakọ na-eme, bụ́ ndị ha ga-enweta n’ụzọ dị mfe. N’ebe o kwere omume, mee ndokwa ka ha kirie vidio bụ́ Our Whole Association of Brothers ka ha wee nwee ike ijiri anya ha hụ ịdị n’otu, ọṅụ, na ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Jehova!
9 Ọ dị mkpa ka ndị nwere mmasị mụta otú ha pụrụ isi gosipụta nsọpụrụ na nkwanye ùgwù maka Jehova n’onwe ha. Kọwaa na ekpere sitere n’obi na-amasị Jehova nakwa na Ọ bụ isi iyi na-adịgide adịgide nke ume ọhụrụ ime mmụọ. (1 Jọn 5:14) N’iji ihe ọmụmụ nke 8 ruo nke 12 nke broshuọ Na-achọ eme ihe, kọwaa ụdị àgwà ndị na-egosi ịsọpụrụ Jehova. Site n’ịtụle ihe e kwuru na broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova, peeji nke 30-31, gbaa ndị ọhụrụ ume iche echiche banyere ohere nke ịsọpụrụ Jehova site n’ikere òkè n’onwe ha n’ọrụ nkwusa.
10 Inwe ekele maka àjà Jisọs chụrụ nakwa maka ihe ùgwù anyị nwere ije ozi dị ka ndị na-eso ụzọ ya, na-asọpụrụ Nna ahụ ma na-ewetara ndị ọzọ ngọzi. Jisọs kwere nkwa, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ejere m ozi, ya ka Nna m ga-asọpụrụ.”—Jọn 12:26.