Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Teta! Sept. 8
“Ndị toworo eto na-atụ anya ka ndị ntorobịa na-enwe ọṅụ n’ihi na o yiri ka hà na-ebi ndụ nke enweghị nchegbu. N’ezie ha adịghị enwe nchegbu ndị toworo eto na-enwe. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ntorobịa adawo mbà n’obi. Ị̀ maara ihe kpatara ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-akọwa ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata ya nakwa ụzọ a pụrụ isi nyere ndị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi aka. [Ị pụrụ ịgụ 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.]”
Ụlọ Nche Sept. 15
“E nwere ndị hụrụ eziokwu n’anya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile. Ma, okpukpe n’ozuzu ya na-ekewakarị ụmụ mmadụ. Gịnị ka ọ ga-ewe iji mee ka ndị nwere obi eziokwu dịrị n’otu? [Mgbe onye ahụ zaghachisịrị, gụọ Zefanaịa 3:9.] Magazin a na-egosi otú ihe ọmụma nke ezi Chineke ahụ si eme ka ndị mmadụ dị n’otu n’ebe nile.”
Ụlọ Nche Oct. 1
“Ị pụrụ ikweta na inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ aghọwo isiokwu na-adịghị amasị ọtụtụ ndị mmadụ. Ma n’ihi gịnị ka o ji dị otú a? [Mgbe a zaghachisịrị, gụọ Ndị Hibru 11:1.] Magazin a na-atụle ihe ezi okwukwe bụ na ihe inwe okwukwe ma ọ bụ enweghị okwukwe na-arụpụta.”
Teta! Oct. 8
“Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị anọwo na-ebu n’obi na a ga-anọgide na-enwe nri n’ụba. Ma ugbu a, e nwere nchegbu na sayensị pụrụ ịdị na-etinye ebe anyị na-esi enweta ihe oriri n’ihe ize ndụ. Magazin a na-akọwa ụfọdụ n’ime nchegbu ndị ahụ nakwa olileanya Bible e nwere maka ezi ihe ngwọta nye nsogbu ahụ.”