Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Sept. 15
Kwuo otu ihe a kọrọ n’akụkọ ụwa nke na-echegbu ndị bi n’ókèala unu. Jụzie onye nwe ụlọ, sị: “Ì chere na amaokwu Bible a kọwara oge anyị bi na ya nke ọma? [Gụọ 2 Timoti 3:1, ị gụsịa ya, gị echere ka ọ zaa.] Magazin a tụlere ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ, ma kwuo ihe anyị kwesịrị ime.”
Ụlọ Nche Oct. 1
“Ndị ọkachamara banyere ihe ndị dị ndụ na-anwa ime ka ọrịa belata na ime ka anyị na-ebitekwu ndụ aka. Ì chere na ọ dị mgbe mmadụ ga-emecha biwe ndụ ruo mgbe ebighị ebi? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe mere anyị ji achọkarị ibi ogologo ndụ. [Gụọ Eklisiastis 3:11.] Magazin a kọwara ihe mere Chineke jiri kee anyị ka anyị na-enwe ọchịchọ nke ịdị ndụ ebighị ebi.”
Teta! July-Sept.
“Ọ bụrụ na i zutere onye ka na-eto eto, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ị̀ gwatụla ndị mụrụ gị ka ha kọọrọ gị ihe ọ na-ewe ha iji lekọta ezinụlọ unu? [Chere ka ọ zaa.] Ọ dị mma ime otú ahụ ma ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ụdị nnwere onwe na obi iru ala mmadụ na-enweta ma ọ bụrụ na ọ naghị eji ụgwọ n’ụzọ na-enweghị isi. [Gụọ Ilu 1:5.] Isiokwu a dị na peeji nke 13 nke magazin a na-egosi site na Bible otú ị pụrụ isi zere ịdị na-emefusị ego gị.”
“Mgbe ụfọdụ ndị gụsịrị akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị ka nke a m chọrọ ịgụrụ gị ugbu a, ha na-abịa kwere na mmụọ nsọ bụ onye. [Gụọ Matiu 3:16, 17.] Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si aghọta ya? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a malitere na peeji nke 30 nke magazin a kwuru ụzọ ihe atọ mere echiche ahụ bụ́ na mmụọ nsọ bụ onye na-ejighị kwekọọ n’ihe Bible na-akụzi n’ezie.”