Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Sept. 15
“Ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe okwu ndị a a maara nke ọma n’ekpere ha. [Gụọ Matiu 6:10.] Olee otú i chere ndụ ga-adị ma ọ bụrụ na a na-emezu uche Chineke n’ụwa? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-atụle ihe akụkụ nke ọ bụla nke Ekpere Onyenwe anyị pụtara, gụnyere akụkụ a anyị ka gụpụrụ ugbu a.”
Ụlọ Nche Oct. 1
“Anyị nile na-atụ anya ịhụ njedebe nke ime mpụ, ime ihe ike, na agha. Ì chere na ọ dị mgbe anyị ga-ahụ mmezu nke okwu ndị a? [Gụọ Abụ Ọma 37:11. Mgbe ahụ, nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-atụle njikọ dị n’etiti nkwa a na nzube mbụ nke Chineke banyere ihe a kpọrọ mmadụ na otú anyị pụrụ isi kere òkè na ya.”
Teta! Oct. 8
“Ọtụtụ mmadụ na-enwe nchegbu banyere otu nsogbu na-arịwanye elu n’etiti ndị ntorobịa—ịṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ. Ị̀ nụtụla banyere ya? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ, gụọ Ilu 20:1.] Ịṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ na-ewetara ndị na-eto eto ọtụtụ ihe ize ndụ. Isiokwu a nwere ihe ọmụma pụrụ inyere ha aka iguzogide nrụgide nke ịṅụbiga mmanya ókè.”
“Ọ́ bụghị ihe dị mwute na kwa afọ, ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ dị afọ iri na ụma bụ́ ndị na-alụbeghị di na-atụrụ ime? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-atụle ihe ndị a pụrụ ime iji merie ọtụtụ ihe ịma aka nke ịbụ nne mgbe a dị afọ iri na ụma. Ọ na-atụlekwa otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka izere ịbanyedị ná nsogbu a abanye.” Gụọ 2 Timoti 3:15.