United by Divine Teaching—Ikiri Ezi Ịdị n’Otu nke Ụmụnna
Otu onye nlekọta sekit sooro gaa duziere otu nwanyị na-amalitebeghị ịga nzukọ ọgbakọ ọmụmụ Bible. Onye nlekọta sekit ahụ kpọrọ ya ka ọ bịa kirie vidio bụ́ United by Divine Teaching. Ọ gara nzukọ n’izu ahụ ma kwuo na obi dị ya nnọọ ụtọ na ya gara. Gịnị mere vidio a ji rụpụta ihe ngwa ngwa otú a? Ngosi o gosiri ịdị n’otu ụmụnna anyị dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke a na-etinye n’ọrụ n’ime ụwa nke ime ihe ike na ịkpọasị masịrị ya.—Jọn 13:35.
Kirie vidio a iji hụ ma nwee mmetụta nke udo na ịhụnanya nke Ndịàmà Jehova gbaa ụwa gburugburu nwere. Mgbe ahụ tụgharịa uche n’ajụjụ ndị a:
(1) Gịnị mere “Izi Ihe Chineke” ji bụrụ isiokwu kwesịrị ekwesị maka mgbakọ ndị e nwere na 1993-1994?—Maị. 4:2.
(2) Gịnị ka eziokwu Bible pụtaworo nye ọtụtụ ezinụlọ? Gịnị ka ọ pụtaworo nye ezinụlọ nke gị?
(3) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịbụ onye Jehova ziri ihe?—Ọma 143:10.
(4) Ụdị ihe isi ike dịgasị aṅaa ka a na-aghaghị imeri iji kwadebe maka mgbakọ mba nile ndị buru ibu?
(5) Olee otú i siworo hụ ka Abụ Ọma 133:1 na Matiu 5:3 si mezuo ná mgbakọ ndị Kraịst ndị ị gaworo?
(6) Ihe àmà dị aṅaa ọha na-ahụ ka e nwere banyere mmetụta dị ike nke izi ihe Chineke?—Mkpu. 7:9.
(7) Gịnị bụ ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ezi ndị Kraịst e metụworo baptism n’otu oge?
(8) Olee ihe Maịka, Pita, na Jisọs kwuru nke na-emezu n’etiti Ndịàmà Jehova?
(9) Gịnị na-egosi gị na ezinụlọ ụmụ mmadụ nwere obi ụtọ, nke dị n’otu abụghị nrọ?
(10) Olee ndị ị ga-egosi vidio a, n’ihi gịnịkwa?
Ka o kirisịrị vidio a, otu nwanna nwanyị chịkọtara ya n’ụzọ dị mma, sị: “Vidio ahụ ga-enyere m aka ịnọgide na-eburu n’uche na ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst gbaa ụwa gburugburu ji iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi ugbu a. . . . Lee ihe dị oké ọnụ ahịa ịdị n’otu ụmụnna anyị bụ!”—Efe. 4:3.