Anyị Nwere Ngwá Ọrụ Ọhụrụ Maka Iji Na-amalite Ọmụmụ Ihe!
1 Otu nwanyị bụ́ onye America na-anụ nnọọ ọkụ n’obi n’okpukpe Roman Katọlik. O ji ikwesị ntụkwasị obi na-agbachitere ozizi dị iche iche nke chọọchị ya. Ọbụna o mere njem ịga ala nsọ bụ́ Vatican. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya n’ụlọ ya, o kwetara ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ chọrọ ịmata ihe Bible na-ekwu, chọọchị ya adịghịkwa eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. Gịnị ka ahụmahụ a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị amaghị ndị nwere ike ịnakwere ọmụmụ Bible ebe obibi a na-eduzi n’efu.—Ekli. 11:6.
2 Ọ̀ dịtụwo mgbe ị lara azụ n’ịgwa ndị mmadụ na anyị dị njikere iso onye ọ bụla nwere mmasị mụọ Bible? Mmadụ nile nọ n’ógbè gị hà maara na anyị na-ekwe nkwa ime ihe a a na-adịghị akwụ ụgwọ maka ya? Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ha maara? Site n’iji ngwá ọrụ ọhụrụ na-eme ihe! Ọ bụ traktị mara mma nke dị peeji isii, nke a kpọrọ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? Ka anyị matakwuo ihe dị n’ime traktị a, site n’otu isiokwu nta gaa n’ọzọ.
3 “N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Gụọ Bible?” Ihe ndị traktị ahụ sịrị mere a ga-eji gụọ Bible na-akpali mmasị. Ọ na-akọwa na Bible nwere “ntụziaka ịhụnanya sitere n’aka Chineke,” na-egosi otú a pụrụ isi gakwuru ya n’ekpere maka enyemaka na ụzọ isi nweta onyinye ya nke bụ́ ndụ ebighị ebi. (1 Tesa. 2:13) Traktị ahụ na-ezo aka ‘n’eziokwu dị iche iche na-enye nghọta’ ndị dị n’ime Bible, dị ka ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ nakwa ihe mere e ji nwee ọtụtụ nsogbu n’ụwa. Ọ na-akọwa “ụkpụrụ omume ndị Chineke nyere bụ́ ndị dị n’ime Bible,” ndị na-eweta abamuru nkịtị ma na-eme ka e nwee obi ụtọ, olileanya, na àgwà ndị ọzọ dị mma, mgbe e tinyere ha n’ọrụ. Traktị ahụ na-ezo aka n’otu ihe ọzọ mere a ga-eji na-agụ Bible—amụma ndị e buru banyere ọdịnihu bụ́ ndị na-egosi ihe ndị gaje nnọọ iwere ọnọdụ n’isi nso.—Mkpu. 21:3, 4.
4 “Enyemaka Iji Ghọta Bible”: Traktị ahụ na-ekwu, sị: “Anyị nile chọrọ enyemaka iji ghọta Okwu Chineke.” Ọ kọwaziri usoro anyị ji na-amụ Bible: “Ọ na-akasị mma iji nwayọọ nwayọọ na-amụ Bible malite n’ozizi ndị bụ́ isi.” Ọ bụ ezie na o mere ka o doo anya na “Bible bụ o kwuchaa o bie,” traktị ahụ kpọtụrụ broshuọ Na-achọ aha kpọmkwem dị ka ihe ga-enyere onye a na-amụrụ ihe aka “ịghọta ebe dị iche iche e zoro aka na ha n’Akwụkwọ Nsọ n’isiokwu dị iche iche.” Isiokwu nta ọzọ na-esonụ welitere ajụjụ chọrọ azịza.
5 “Ị̀ Dị Njikere Iwepụta Oge Kwa Izu Iji Ghọta Bible?” Traktị ahụ na-akọwa na a pụrụ ịhazi ọmụmụ Bible n’oge na n’ebe ga-akara onye a na-amụrụ ihe mma, ọ pụrụ ịbụ n’ebe obibi ya nanị ya ma ọ bụ ọbụna site n’iji telifon na-eme ihe. Ònye pụrụ ikere òkè ná nkwurịta okwu ahụ? Traktị ahụ na-aza, sị: “Ndị ezinụlọ gị nile. Ndị enyi gị ọ bụla i kpebiri ịkpọ pụkwara ikere òkè. Ma ọ̀ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị chọọ, a pụrụ iso nanị gị na-enwe nkwurịta okwu ahụ.” Ruo ogologo oge hà aṅaa ka mmadụ na-aghaghị ịmụ ihe? Ọ na-akọwa, sị: “Ọtụtụ ndị na-ewepụta otu awa kwa izu iji mụọ Bible. Ọ bụrụ na ị pụrụ iwepụtakwu oge ma ọ bụ ọ bụrụ na ị pụrụ iwepụta nanị oge dị ntakịrị karị kwa izu, Ndịàmà ga-ewepụta onwe ha inyere gị aka.” Nke ahụ bụ isi ihe dị mkpa! Anyị dị njikere ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ nke onye ọ bụla anyị na-amụrụ ihe.
6 “Òkù Ịmụta Ihe”: E nwere akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta bụ́ ebe onye natara traktị ahụ pụrụ ịrịọ maka broshuọ Na-achọ ma ọ bụ ịrịọ ka a kpọtụrụ ya iji kọwaara ya usoro ọmụmụ Bible ebe obibi anyị na-eduzi n’efu. E sepụtara ihu broshuọ Na-achọ n’àgwà zuru ezu. Ị́ hụghị ihe mere traktị a ga-eji gbaa ọtụtụ ndị ọzọ nwere obi eziokwu ume ịnakwere enyemaka anyị? Ugbu a, olee otú anyị pụrụ isi jiri ngwá ọrụ ọhụrụ a mee ihe n’ụzọ kasị mma?
7 Ònye Ka Ị Pụrụ Inye Traktị Ahụ? A pụrụ inye mmadụ traktị ahụ n’aka ma ọ bụ tinye ya n’ụlọ ebe ndị a na-enwetaghị ndị mmadụ. A pụrụ ikesa ya site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’okporo ámá, nakwa n’ógbè azụmahịa. Nyefee ya ndị mmadụ ma hà naara akwụkwọ anyị ma ha anaraghị ya. Tinye ya n’ime magazin ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ a na-enyefe. Tinye ya n’ime akwụkwọ ozi ndị i dere. Gwa ndị ị kpọtụụrụ na telifon na ị ga-ezitere ha ya. Hụ na i nwere mgbe nile, ndị ị ga-ekesa mgbe ị gara ịzụta ihe n’ahịa, mgbe i ji ụgbọ njem ọha na eze na-eme ihe, na mgbe ị na-agba àmà mberede. Nye ya onye ọ bụla bịara n’ụlọ gị. Nye ya ndị ikwu gị, ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, na ndị ọzọ ị maara. Gbalịa inyefe onye ọ bụla i zutere traktị a! Mgbe ahụ, gịnị ga-emezi?
8 Ọ Bụrụ na E Meghachi Omume Ozugbo: Ụfọdụ ndị ga-emeghachi omume ozugbo site n’ikwu na ha ga-achọ ka e duziere ha ọmụmụ Bible. Ya mere, mgbe ọ bụla ị nọ n’ozi ubi, jide n’aka na i ji broshuọ Na-achọ abụọ—otu maka onye ị ga-amụrụ ihe, nke ọzọ maka onwe gị. Ọ bụrụ na onye ahụ dị njikere, malite ọmụmụ ihe ahụ ozugbo. Sapeta peeji nke abụọ, ma gụọ “Ụzọ Isi Jiri Broshuọ a Mee Ihe.” Mgbe ahụ, gaa kpọmkwem n’ihe ọmụmụ nke 1, ma gosi otú e si enwe ọmụmụ ihe ahụ. Ọ̀ bụ na nke a adịghị nnọọ mfe?
9 Ọ Bụrụ na Onye Na-ege Gị Ntị Chọrọ Oge Iji Chebara Ya Echiche: Tupu ogologo oge agafee, gbalịa ịkpọtụrụ ya ọzọ. Mgbe ị na-eme nke ahụ, jide n’aka na i ji broshuọ Na-achọ. Gosi ya ebe e depụtara ihe ndị dị n’ime ya bụ́ nke dị na peeji nke abụọ. Gwa ya ka ọ họrọ ihe ọmụmụ nke yiri ka ọ̀ ga-amasị ya karịsịa. Sapeta ya, ma malite ịtụle ihe ọmụmụ ahụ ọ họọrọ.
10 Isochi Magazin Ndị E Tinyere: Ọ bụrụ na i nyefekọtara traktị ahụ na magazin ụfọdụ, ị pụrụ ikwu ihe dị otú a mgbe ị gaghachiri: “N’oge gara aga mgbe m bịara, enwere m obi ụtọ ịhapụrụ gị magazin Ụlọ Nche. Ikekwe ị chọpụtara na aha magazin ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova. Taa, ọ ga-amasị m ịkọwa ihe Alaeze a bụ na ihe ọ ga-apụtara gị na ezinụlọ gị.” Mgbe ahụ, sapeta ihe ọmụmụ nke 6 na broshuọ Na-achọ. Malite na paragraf nke mbụ, gụọ ma tụlee ya ruo n’ókè onye nwe ụlọ nwere oge. Mgbe ahụ, mee ndokwa ịgaghachi n’ụbọchị ọzọ iji tụlezuo ihe ọmụmụ ahụ.
11 Ya Adịla Mgbe Ọ Bụla Traktị ahụ Ga-akọ Gị: Onye nlekọta ije ozi na ụmụnna na-ahụ maka akwụkwọ kwesịrị ịhụ na e nwere traktị bụ́ Ịmata Bible otú ga-ezuru ọgbakọ n’oge nile. Tinye ụfọdụ n’akpa uwe gị ma ọ bụ n’ime pọọsụ gị, n’ime ụgbọala gị, n’ebe ọrụ gị, n’ụlọ akwụkwọ, n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ gị—n’ebe ọ bụla aka ga-eru ha ngwa ngwa. Tinyekwa ụfọdụ n’ime akpa ozi ọma gị maka mgbe ị ga-ezute onye gị na ya pụrụ ikwurịta banyere Bible.
12 Ka Jehova Gọzie Mgbalị Anyị: Ihe mgbaru ọsọ dị mma nke Ndị Kraịst nile bụ ịkụziri onye ọzọ eziokwu ahụ. (Mat. 28:19, 20) Ì nwere ọmụmụ Bible ebe obibi ị na-eduzi ugbu a? Ọ bụrụ na i nwere, ị̀ pụrụ iwepụta oge n’usoro ihe omume gị kwa izu maka iji na-eduzikwu ọzọ? Ọ bụrụ na i nweghị ọmụmụ ihe ị na-eduzi ugbu a, n’ezie ị ga-achọ inwe nke ị ga na-eduzi. Kpegara Jehova ekpere ka ọ gọzie mgbalị gị n’ịchọta onye ị ga na-amụrụ ihe. Mgbe ahụ, rụọ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere ahụ.—1 Jọn 5:14, 15.
13 Anyị nwere ngwá ọrụ ọhụrụ maka iji na-amalite ọmụmụ ihe! Mara ihe dị n’ime ya nke ọma. Kesaara ya mmadụ nile. Mee ihe nile i nwere ike ime ‘ịrụ ọrụ ọma, ịba ọgaranya n’ezi ọrụ, ịdị na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe’ ị mụtaworo banyere Okwu Chineke.—1 Tim. 6:18.
Igbe dị na peeji nke 4]
OHERE NDỊ E NWERE IJI KESAA TRAKTỊ AHỤ
◼ Mkparịta ụka ndị a na-enwe n’ụbọchị
◼ Mgbe mmadụ naara akwụkwọ anyị
◼ Mgbe ọ na-adịghị onye nọ n’ụlọ
◼ Mgbe anyị na-eme nletaghachi
◼ Mgbe anyị zutere mmadụ n’oge anyị na-agba àmà n’okporo ámá
◼ Mgbe anyị na-agba àmà n’ógbè azụmahịa
◼ Mgbe a na-agba àmà mberede
◼ Mgbe anyị na-ede akwụkwọ ozi
◼ Mgbe anyị nọ n’ụgbọ njem ọha na eze
◼ Mgbe mmadụ bịara n’ebe obibi anyị
◼ Mgbe anyị na ndị ikwu, ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị ọzọ anyị maara, na-ekwurịta okwu