Ịchịkọta Ndị Mmadụ Site n’Asụsụ Nile
1 Okwu Chineke na-emezu! Ndị si “n’asụsụ nile nke mba nile” na-anakwere ezi ofufe. (Zek. 8:23) Olee otú Ndịàmà Jehova si na-enyere ndị dị iche iche si ‘n’ebo, ndị, na asụsụ’ nile aka ịbụ ndị dị ọcha n’anya Jehova, n’atụmanya nke ịlanarị “oké mkpagbu ahụ”?—Mkpu. 7:9, 14.
2 Nzukọ Chineke Na-eme Ihe: Òtù Na-achị Isi emewo ndokwa ka e wepụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ihe dị ka n’asụsụ 380 ka ndị mmadụ nọ n’ụwa nile nwee ike ịghọta ịdị mkpa nke ozi ọma ahụ n’ụzọ doro anya. Ịkwadebe na ibipụta akwụkwọ n’ọtụtụ asụsụ bụ nnukwute ọrụ. Ọ na-agụnye ịkpọkọta ìgwè ndị nsụgharị ruru eru na inyere ha aka n’ebe ndị ha chọrọ enyemaka iji na-asụgharị akwụkwọ anyị gaa n’asụsụ ndị a nile, tinyere ibi na ibupụ ha. Otú ọ dị, ọ bụ ndị nkwusa Alaeze n’otu n’otu, bụ́ ndị na-ewegara ndị mmadụ ozi Bible nke na-azọpụta ndụ, na-arụ ọrụ bụ́ isi.
3 Ịnakwere Ihe Ịma Aka Ahụ: Na Nigeria, e nwere ọtụtụ ndị bi n’ebe na-abụghị obodo ha. Iji kwusaara ndị a ozi ọma, ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke na-agbalị ịmụ asụsụ ọhụrụ ndị a na-asụkarị n’ógbè ebe ha bi. Ọtụtụ na-amụ Ụdị Asụsụ Ogbi nke America iji kwusaara ndị ntị chiri ozi ọma. Ugbu a, anyị nwere ọtụtụ ìgwè ndị na-asụ asụsụ ogbi ná mba a. E wezụga Bekee, a na-ebipụta akwụkwọ anyị n’ihe karịrị asụsụ iri a na-asụ na Nigeria. Ndị ụfọdụ na-anụtụbeghị banyere Jehova ma ọ bụ ndị na-amaghị ihe ọ bụla banyere Bible na-amụ ma na-anakwere eziokwu nke Okwu Chineke.—Rom 15:21.
4 Ànyị pụrụ ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu karị n’ikwusara ndị bi n’ókèala anyị, bụ́ ndị si ná mba ọzọ ozi ọma ahụ? (Kọl. 1:25) Ụfọdụ ọgbakọ na-ahazi ọrụ ime nkwusa n’etiti ndị si ala ọzọ bi n’ógbè ha. Ndị nkwusa na-ebu ụzọ mụta asụsụ ahụ otú zuru ezu iji nwee ike izi ozi dị mfe, dị ka: “Ndeewo. Nke a bụ ozi ọma anyị wetaara gị. [Mgbe ahụ nyefee traktị ma ọ bụ broshuọ e dere n’asụsụ ahụ.] Ka e mesịa.” N’ezie, Jehova na-agọzi ntakịrị mmalite ndị ahụ!
5 Ozi Alaeze ahụ na-amasị ndị si n’ebe nile na n’asụsụ nile. Ka anyị jiri ohere anyị nwere mee ihe iji soro ha kerịta ya.