Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
1 Iji guzosie ike n’okwukwe n’ime ụwa nke na-akwụsịghị ike, anyị aghaghị ịtụkwasị Jehova obi. Gịnị ka nke a pụtara n’ezie? Olee otú ịtụkwasị Jehova obi si emetụta ndụ anyị na nke ezinụlọ anyị? Olee otú o si enyere anyị aka iguzogide mmetụta nke ụwa Setan? Usoro ihe omume mgbakọ sekit maka afọ ije ozi 2003 ga-aza ajụjụ ndị a. Isiokwu ya bụ́ “Tụkwasị Jehova Obi, Meekwa Ezi Ihe.”—Ọma 37:3.
2 Ntụkwasị obi anyị n’ebe Jehova nọ abụghị nanị n’oge ndị pụrụ iche ma ọ bụ mgbe anyị nọ n’oké ihe isi ike. Ọ na-emetụta ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. E mesiri nnọọ nke a ike n’okwu mmeghe bụ́, “Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Nile.” (Ọma 62:8) Okwu nwere akụkụ anọ nke isiokwu ya bụ “Igosipụta Ntụkwasị Obi n’Ebe Jehova Nọ,” ga-egosi anyị ụzọ isi chọta ma tinye ihe ọmụma dabeere na Bible n’ọrụ, bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, idozi nsogbu ndị a na-enwe n’ime ezinụlọ, na inweta ihe onwunwe ndị dị anyị mkpa.
3 Ụwa Setan na-agbalị ịmanye anyị ịnakwere echiche gbagọrọ agbagọ banyere ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ ma na-eme ka e nwee mgbagwoju anya banyere ihe bụ́ ihe ndị dị mkpa na ndị na-adịghị mkpa. (Aịsa. 5:20) Okwu bụ́ “Nọrọ na Nche Megide Ihe Efu Dị Iche Iche nke Ndụ” nakwa okwu bụ́ “Zerenụ Ihe Ọjọọ—Bụrụnụ Ndị Na-eme Ezi Ihe” ga-eme ka mkpebi anyị mere ịgbasosi ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova ike sikwuo ike.—Emọs 5:14.
4 Mgbe Jehova ga-eweta ajọ usoro ihe dị ugbu a ná njedebe, ọ ga-adị ndị ohu Chineke mkpa ịtụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu. E mere ka nke a pụta ìhè n’okwu ihu ọha bụ́, “Nnapụta Pụọ ná Nsogbu Ụwa Dị Nso.” Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-agba anyị ume inyocha onwe anyị n’okwu bụ́ “À Ga-agụ Gị n’Onye Ruru Eru Iketa Alaeze Chineke?” A ga-eji okwu agbamume bụ́ “Tụkwasịnụ Nkwa Dị Iche Iche nke Jehova Obi” wee mechie usoro ihe omume ahụ.
5 Otu ihe na-adịkarị ịrịba ama ná mgbakọ ọ bụla bụ okwu baptizim. Onye ọ bụla nke chọrọ ka e mee ya baptizim kwesịrị ime ka onyeisi oche ndị nlekọta mara ngwa ngwa nke a kwere mee ka e wee nwee ike ime ndokwa ndị dị mkpa.
6 N’oge ndị a a na-ejighị n’aka, ọ bụ nanị Jehova bụ onye pụrụ ime ka e nwee obi ike ma guzosie ike n’ezie. (Ọma 118:8, 9) Ka anyị nile mee ka ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike site n’ịnọ n’usoro ihe omume dum nke mgbakọ sekit ahụ.