Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
Anyị maara na Jehova Chineke kwesịrị inweta ịhụnanya anyị na ofufe anyị a na-ekewaghị ekewa. Otú ọ dị, ụwa na-achọ iji ihe ụ̀ra dọpụ anyị n’ịnọgide soro Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya. (Jọn 17:14) Iji wusikwuo ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ike nakwa iji wusie anyị ike iguzogide ihe ndị dị n’ụwa bụ́ ndị na-etinye ọnọdụ ime mmụọ anyị n’ihe ize ndụ, usoro ihe omume ọhụrụ nke mgbakọ sekit maka afọ ije ozi 2001 ga-enwe isiokwu bụ́ “Hụ Chineke n’Anya—Ọ Bụghị Ihe Ndị Dị n’Ụwa.”—1 Jọn 2:15-17.
Ịhụnanya miri emi n’ebe Jehova nọ na-akpali anyị ịgba àmà banyere ya. Ọbụna otú ahụ, ozi ubi anaghị adịrị ọtụtụ ndị Chineke mfe. N’isiokwu bụ́ “Ịhụnanya Maka Chineke Na-akpali Anyị n’Ozi Anyị,” mụta otú ọtụtụ ndị siworo merie ihere na ihe mgbochi ndị ọzọ iji kere òkè zuru ezu n’ọrụ a.
Olee otú ụkpụrụ na-ajọwanye njọ nke ụwa si emetụta anyị? Omume ndị a na-ewerebu dị ka ihe ọjọọ bụzi ndị a sịrị na ha bụ akparamàgwà dị otú ha kwesịrị. Okwu bụ́ “Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Na-akpọ Ihe Ọjọọ Asị” nakwa usoro isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Dị n’Ụwa—Olee Ụzọ Anyị Si Ele Ha Anya?” ga-eme ka mkpebi anyị sikwuo ike ịjụ agụụ ihe ọjọọ.
Usoro ihe omume ahụ ga-agụnye Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi ihe nlereanya, tinyere nchịkọta nke isiokwu Ụlọ Nche dịịrị ọmụmụ n’izu ahụ. Okwu Ihu Ọha bụ́ “Otú Ịhụnanya na Okwukwe Si Emeri Ụwa,” ga-agba anyị ume iṅomi Jisọs n’iguzogide nrụgide ndị sitere n’ụwa. (Jọn 16:33) Jide n’aka na ị kpọrọ ndị ị na-amụrụ Bible òkù ịbịa. Onye ọ bụla chọrọ ka e mee ya baptism kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta ngwa ngwa o kwere mee ka e wee nwee ike ime ndokwa ndị dị mkpa.
Mgbakọ sekit a ga-eme ka uche anyị dịrị kpọmkwem n’ebe ịhụnanya anyị kwesịrị ịdị iji nweta ngọzi bara ụba nke Jehova. Ahapụla akụkụ ọ bụla n’ime ya!