Na-akpọsa Ozi Alaeze Ahụ
1 ‘Aghaghịkwa m ịkpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.’ (Luk 4:43) Jizọs ji okwu ndị ahụ mee ka a mata isiokwu nke ozi ya—Alaeze Chineke. Ozi anyị na-akpọsa taa hiwekwara isi n’Alaeze ahụ, dị ka e buru n’amụma na Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” Eziokwu dị aṅaa banyere Alaeze Chineke ka ọ dị mkpa ka ndị mmadụ nụ?
2 Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a site n’eluigwe, ọ ga-anọchikwa anya ịchịisi nile nke ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya. A chụpụworị Ekwensu n’eluigwe, ajọ usoro ihe dị ugbu a abanyewokwa n’ụbọchị ikpeazụ ya. (Mkpu. 12:10, 12) A ga-ebibi ajọ usoro ihe ochie Setan kpam kpam, ma Alaeze Chineke agaghị ama jijiji. Ọ ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.—Dan. 2:44; Hib. 12:28.
3 Alaeze ahụ ga-emeju ọchịchọ ziri ezi nke ụmụ mmadụ nile na-erube isi. Ọ ga-ewepụ nhụsianya nke agha, mpụ, mmegide na ịda ogbenye na-akpata. (Ọma 46:8, 9; 72:12-14) Mmadụ nile ga-enwe ihe oriri n’ụba. (Ọma 72:16; Aịsa. 25:6) Nrịanrịa na nkwarụ ga-abụ nanị ihe ndị gafeworo agafe. (Aịsa. 33:24; 35:5, 6) Ka ihe a kpọrọ mmadụ na-eru izu okè, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ndị mmadụ ga-ebikọkwa ọnụ n’ịdị n’otu.—Aịsa. 11:6-9.
4 Anyị na-egosi na anyị chọrọ ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị site n’ụzọ anyị si ebi ndụ ugbu a. Ozi Alaeze ahụ kwesịrị inwe mmetụta n’ụzọ ndụ anyị dum, gụnyere ihe mgbaru ọsọ anyị na ihe ndị anyị na-ebute ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na anyị nwere ibu ọrụ nke inye ezinụlọ anyị ihe ndị na-akpa ha, anyị agaghị ekwe ka nchegbu akụ̀ na ụba kpagbuo ihe ndị metụtara Alaeze. (Mat. 13:22; 1 Tim. 5:8) Kama nke ahụ, anyị aghaghị ịṅa ntị na ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile [ihe ndị dị mkpa ná ndụ].”—Mat. 6:33.
5 Ọ dị oké mkpa ka ndị mmadụ nụ ma rube isi n’ozi Alaeze ahụ mgbe oge ka dị. Ka anyị nyere ha aka ime otú ahụ site ‘n’iji ịrụ ụka nke na-eme ka e kweta na-ekwu okwu dị iche iche banyere alaeze Chineke.’—Ọrụ 19:8.