Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/03 p. 1
  • Leta Si n’Alaka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Leta Si n’Alaka
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Àmà nke Ịhụnanya, Okwukwe na Nrubeisi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ileta Ebe Obibi Akwụkwọ Pụrụ Iche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Nke Mbụ Otu Narị Afọ Gara Aga
    Teta!—2001
  • Leta Alaka
    Ozi Alaeze Anyi—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 9/03 p. 1

Leta Si n’Alaka

Ezigbo Ndị Nkwusa Alaeze:

“Chineke nọgidere na-eme ka ọ na-eto.” (1 Kọr. 3:6) Lee ka o siworo bụrụ ihe na-akpali akpali ịhụ uto n’ubi Nigeria! N’afọ ije ozi 2003, a malitere ihe karịrị ọmụmụ Bible 90,000. Nke a kwesịrị ịja mma.

Jehova na-agọzi ọrụ a na-arụ n’usoro owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ugbu a, e nwere ìgwè 29 na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria. N’afọ ije ozi 2003, anyị anọwo na-ewucha otu Ụlọ Nzukọ Alaeze kwa ụbọchị ọrụ ọ bụla. Ọnụ ọgụgụ ọgbakọ ka ukwuu nweziri Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mma maka ife Chineke anyị, bụ́ Jehova, ofufe.

Iji na-ebipụta akwụkwọ maka ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị na-agụ akwụkwọ anyị n’ụwa nile, e wusawala Ebe Obibi Akwụkwọ dị na Watchtower Farms, nke dị nso na Wallkill, New York. A na-enwe nnọọ ọganihu n’iwunyekwu ohere dị hekta 1.4 na ya. Nke a hà ka Ụlọ Nzukọ Alaeze 30 ndị hà otú kwesịrịnụ! E mewo atụmatụ ibute ígwè obibi akwụkwọ abụọ buru oké ibu bụ́ ndị kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ ná mmalite afọ 2004. Nke ọ bụla n’ime ígwè obibi akwụkwọ ndị ahụ ga-enwe ike ịdị na-ebipụta ihe ruru magazin 25 n’otu sekọnd. A ga-arụnyekwa ígwè ọrụ ndị ọhụrụ e ji adụkọta akwụkwọ na ndị e ji ahụ maka ibupụ akwụkwọ n’afọ 2004. Nke a ga-eme ka e jiri ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ka nta na-arụpụta ihe dị ukwuu karị.

Ka anyị na-amalite afọ ije ozi 2004, anyị na-esonyere unu n’ikpe ekpere ka Jehova ‘nọgide na-eme ka ọ na-eto.’

Ụmụnna unu,

Alaka Ụlọ Ọrụ Nigeria

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya