Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/04 p. 1
  • Ọrụ Chineke Na-akwado

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Chineke Na-akwado
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-enye Ọkịka nke Ike
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Jiri Ozi Ọma Ị Na-ekwusa Kpọrọ Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Bara Uru Na-enweghị Atụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 10/04 p. 1

Ọrụ Chineke Na-akwado

1 N’etiti ndị ohu Chineke taa, ọ bụ mmadụ ole na ole gụrụ oké akwụkwọ, baa ọgaranya, ma ọ bụ bụrụ ndị a ma ama n’usoro ihe dị ugbu a. N’ihi nke ahụ, ụfọdụ ndị na-ajụ ozi anyị dị ka ihe na-abaghị uru. (Aịsa. 53:3) Otú ọ dị, ọrụ ịkụzi Bible anyị na-arụ ewetaworo ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa nkasi obi na olileanya. Olee otú ndị nkịtị siworo rụzuo ihe dị ịrịba ama otú a? Ọ bụ nanị site ná nkwado Chineke. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 1:8) ‘Chineke họrọkwaara ihe ndị na-adịghị ike nke ụwa,’ ka Pọl onyeozi kọwara, “ka o wee menye ihe ndị dị ike ihere.”—1 Kọr. 1:26-29.

2 Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndịozi na Ndị Kraịst ndị ọzọ nke narị afọ mbụ bụ “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) N’agbanyeghị nke ahụ, ha ji obi ike na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere ha, Jehova gọzikwara mgbalị ha. N’agbanyeghị ihe mgbochi na mmegide, “okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-enwe mmeri n’ụzọ dị ike.” Ọ dịghị ihe pụrụ igbochi ọrụ ahụ n’ihi na Chineke nọ na-akwado ya. (Ọrụ 5:38, 39; 19:20) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge a. Ọbụnadị mmegide siri ike nke ndị ọchịchị dị ike enwebeghị ike igbochi ozi ọma ahụ inwe mmeri na ito eto.—Aịsa. 54:17.

3 Otuto Nile Bụ nke Chineke: Ihu ọma anyị nwere dị ka ndị ozi Chineke ò kwesịrị ime ka anyị na-etu ọnụ? Ọ dịghị ma ọlị. N’izo aka n’ozi Ndị Kraịst, Pọl dere, sị: “Anyị nwere akụ̀ a n’arịa e ji ụrọ kpụọ, ka ike karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke sitere n’aka anyị onwe anyị.” (2 Kọr. 4:7) Pọl ghọtara na ọ bụ nanị site n’ume Chineke nyere ya ka o ji nwee ike ijezu ozi ya.—Efe. 6:19, 20; Fil. 4:13.

4 Anyị onwe anyị kwa na-aghọta na ọ bụ nanị n’ihi na anyị ‘enwetawo enyemaka sitere n’ebe Chineke nọ’ ka anyị ji na-arụzu ọrụ nkwusa ahụ. (Ọrụ 26:22) Site ná mkpọsa dị otú ahụ zuru ụwa ọnụ, Jehova ji anyị eme ihe n’ụzọ dị ukwuu iji mee ka mba nile mee mkpatụ—onyinyo nke mmezu kpụ ọkụ n’ọnụ nke ihe e kpere n’ikpe bụ́ nke ga-ewere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya. (Hag. 2:7) Lee ihe ùgwù anyị nwere ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” n’owuwe ihe ubi ime mmụọ a bara ụba!—1 Kọr. 3:6-9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya