Ịgachi Nzukọ Anya—Ihe A Ga-edebe n’Ọnọdụ Mbụ
1 Ezinụlọ Ndị Kraịst na-edebe ịgachi nzukọ ọgbakọ anya n’ọnọdụ mbụ. Ma mkpa ndị e nwere ná ndụ taa pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ọrụ ụlọ, ọrụ Bekee, ma ọ bụ ọrụ ụlọ akwụkwọ ọ̀ malitewo iri oge e dokwara maka iji fee Jehova ofufe? Ile ihe anya otú Jehova si ele ya anya ga-enyere anyị aka ịnọgide na-edebe ihe ndị ka mkpa n’ọnọdụ mbụ.—1 Sam. 24:6; 26:11.
2 Otu nwoke onye Izrel kpachaara anya leghara echiche Jehova anya site n’ịchịkọta nkụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ọ pụrụ icheworị na ya na-egbo mkpa ezinụlọ ya ma ọ bụ na ọ bụ obere ihe. Otú ọ dị, site n’ikpe e kpere ya, Jehova gosiri na ịchụso ihe nke ụwa n’oge ndị a na-eji efe ofufe abụghị obere ihe.—Ọnụ Ọgụ. 15:32-36.
3 Ịnagide Ihe Ịma Aka Ahụ: Nye ọtụtụ ndị, ọ na-esiri ha ike ime ka ọrụ Bekee ghara igbochi ha ịga nzukọ. Ndị ụfọdụ emeriwo ihe ịma aka a site n’isoro onye were ha n’ọrụ kwurịta okwu, isoro ndị ọrụ ibe ha agbanwerịta oge ọrụ, ịchọ ọrụ nke ka kwesị ekwesị, ma ọ bụ ime ka ụzọ ndụ ha dịkwuo mfe. N’ezie, ịchụ àjà dị otú ahụ n’ihi ezi ofufe na-atọ Chineke ụtọ nke ukwuu.—Hib. 13:16.
4 Ọrụ ụlọ akwụkwọ pụkwara iweta ihe ịma aka. “Ana m eme ụfọdụ n’ime ihe omume e nyere m n’ụlọ akwụkwọ tupu oge nzukọ eruo ma rụọ nke fọrọ mgbe m lọtara,” ka otu onye ntorobịa kwuru. Ọ bụrụ na nwatakịrị apụghị imecha ihe omume a na-eme n’ụlọ nke e kenyere ya n’ụbọchị a ga-aga nzukọ, ndị nne na nna ụfọdụ akọwaworo ndị nkụzi na ezinụlọ ha na-edebe nzukọ Ndị Kraịst n’ọnọdụ mbụ.
5 Imekọ ihe ọnụ na iji nlezianya mee nhazi bụ isi ihe ndị ga-eme ka a rụchaa ọrụ ụlọ iji kwadebe maka ịga nzukọ n’oge dị ka ezinụlọ. (Ilu 20:18) Ọbụna a pụrụ ịkụziri ụmụntakịrị iyiri uwe ha na ịdị njikere ịga nzukọ n’otu oge a kara aka. Site n’ihe nlereanya nke ha, ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịkụnye n’ime ụmụ ha ịdị mkpa nke nzukọ.—Ilu 20:7.
6 Ka nrụgide nke usoro ihe dị ugbu a na-amụba, ọ dị mkpa anyị ịdị na-agachi nzukọ ọgbakọ anya. Ka anyị nọgide na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya anya ma na-edebe ịgachi nzukọ anya n’ọnọdụ mbụ.—Hib. 10:24, 25.