Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/04 p. 1
  • Olu Ụtọ Ndị Na-enye Ume Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olu Ụtọ Ndị Na-enye Ume Ọhụrụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Nọrọ Na Nche Megide Egwú Na-adịghị Ewuli Elu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 5/04 p. 1

Olu Ụtọ Ndị Na-enye Ume Ọhụrụ

1 Olu ụtọ na ịbụ abụ bụ ihe ndị dị oké mkpa n’ezi ofufe. N’Izrel oge ochie, Esaf na ụmụnne ya ndị nwoke bụrụ, sị: “Keleenụ Jehova . . . Bụkuonụ Ya abụ, bụkuonụ Ya abụ ọma; tụgharịanụ uche n’oké ọrụ Ya nile.” (1 Ihe 16:8, 9) Taa, anyị na-abụku Jehova abụ ná nzukọ ọgbakọ ndị anyị na-enwe kwa izu. (Efe. 5:19) Lee ohere magburu onwe ya nke a bụ iji too aha ya!—Ọma 69:30.

2 Ige Kingdom Melodies, bụ́ abụ Alaeze ndị e ji ngwá egwú olu ụtọ kụọ, pụrụ ime ka uche anyị jupụta n’ihe ime mmụọ. “Ka a na-akpọ olu ụtọ ndị ahụ, ana m echeta ihe ndị a na-ekwu n’abụ ndị ahụ,” ka otu nwanna nwanyị na-akọwa. “Lee ụzọ magburu onwe ya nke a bụ isi mee ka Jehova dịrị m n’uche ka m na-ege olu ụtọ!”—Fil. 4:8.

3 Oge Ndị A Pụrụ Ige Ha: Ịkpọ Kingdom Melodies n’ebe obibi na-eme ka e nwee ọnọdụ ime mmụọ na-enye obi ụtọ, bụ́ nke so eme ka e nwee udo n’ezinụlọ. “Anyị na-akpọ [olu ụtọ] a ugboro ugboro n’ebe obibi anyị nakwa n’ụgbọala anyị, ọ dịghịkwa mgbe ike na-agwụ anyị ige ha n’ihi ụzọ na-adọrọ adọrọ e si hazie ha,” ka otu ezinụlọ dere. “Mgbe mgbe, abụ Kingdom Melodies emewo ka anyị nọrọ n’ọnọdụ uche dị mma mgbe anyị na-ejikere maka nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ mgbe anyị na-aga mgbakọ.” Otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Ige ha mgbe m na-arụ ọrụ n’ụlọ na-eme ka obi dị m nnọọ mma—ònye ga-ekweta na m ga na-enwe ọṅụ mgbe m na-apịa ákwà? Ana m akpọ olu ụtọ a mgbe m dara mbà n’obi. Olu ụtọ ndị ahụ na-akpali nnọọ akpali! . . . Abụ nke ọ bụla na-enye obi ụtọ.” È nwere oge ndị olu ụtọ ndị ahụ na-enye ume ọhụrụ ga-abara gị uru?

4 Ihe ka ọtụtụ n’ime egwú ndị a na-akụ taa na-egosipụta mmụọ nke ụwa. Ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka ịzụlite mmasị maka egwú ndị dị mma site n’ịdị na-akpọ Kingdom Melodies. Ọ ga-amasịkwa ọtụtụ ndị a na-amụrụ Bible na ndị nwere mmasị, ịmara banyere abụ ime mmụọ ndị a, bụ́ ndị na-enye Jehova otuto ma na-enye obi ụtọ.—Ọma 47:1, 2, 6, 7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya