Mee Ka Anya Gị Na-elegide Otu Ebe
1. Gịnị ka inwe anya na-elegide otu ebe pụtara, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị mkpa?
1 N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs dọọrọ uche gaa ná mmetụta dị ukwuu anya ihe atụ ma ọ bụ nke ime mmụọ pụrụ inwe n’ụzọ ndụ anyị dum. O kwuru, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị dum ga na-enwupụ enwupụ; ma ọ bụrụ na anya gị dị njọ, ahụ́ gị dum ga-agba ọchịchịrị.” (Mat. 6:22, 23) Anya na-elegide otu ebe bụ nke lekwasịrị n’otu ihe—ime uche Chineke—ọ bụghị nke nchekasị na-enweghị isi a na-enwe maka ihe onwunwe na-adọpụ. (Mat. 6:19-21, 24-33) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịhụ na anya anyị nọgidere na-elegide otu ebe?
2. Olee echiche Okwu Chineke na-agba ume ka anyị nwee banyere ihe onwunwe?
2 Ịgbalị Inwe Afọ Ojuju: Igbo mkpa ezinụlọ nke ọma bụ ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro. (1 Tim. 5:8) Ma nke a adịghị achọ na anyị ga-anọgide na-achọ ihe ndị kasị mma na ndị kasị ọhụrụ. (Ilu 27:20; 30:8, 9) Kama nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume inwe afọ ojuju ‘n’ihe oriri na ihe mgbokwasị,’ bụ́ ihe ndị na-akpa mmadụ ná ndụ. (1 Tim. 6:8; Hib. 13:5, 6) Ịgbaso ndụmọdụ a pụrụ inyere anyị aka ime ka anya anyị na-elegide n’ebe kwesịrị ekwesị.
3. Gịnị pụrụ inyere anyị aka izere iji aka anyị ebokwasị onwe anyị ibu arọ?
3 Ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị izere ibokwasị onwe anyị ibu arọ nke iji ụgwọ na-enweghị isi na nke ịchụso ihe onwunwe ma ọ bụ ihe ndị ga na-ewe anyị oge dị ukwuu, ndị anyị ga na-etinyekwa uche nke ukwuu na ha. (1 Tim. 6:9, 10) Ànyị pụrụ isi aṅaa mee nke a? Mgbe ị na-eche ihe ị ga-eme, jiri ekpere tụlee ya ma jiri obi eziokwu chọpụta ma ọ̀ ga-emetụta nchụso ime mmụọ gị. Kpebisie ike ibute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ gị.—Fil. 1:10; 4:6, 7.
4. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịchọ ụzọ anyị ga-esi mee ka ndụ anyị dị mfe?
4 Mee Ka Ndụ Gị Dị Mfe: Ihe ọzọ ga-enyere gị aka iguzogide ndọrọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ ịchọ ụzọ ị ga-esi mee ka ndụ gị dị mfe. Otu nwanna nwoke nke chọpụtara na ezinụlọ ya pụrụ ibi nke ọma n’akwakọbaghị ihe onwunwe, kwuru, sị: “Apụrụ m imekwu nnọọ ihe n’ọgbakọ ugbu a iji jeere ụmụnna m ozi. Ekwenyesiri m ike na Jehova na-agọzi ndị ohu ya nile mgbe ha butere ezi ofufe ụzọ karịa ihe onwe onye.” Ị̀ pụrụ inweta ngọzi ka ukwuu site n’ime ka ndụ gị dị mfe?
5. N’ihi gịnị ka o ji achọ ịnọgide na-eme mgbalị iji mee ka anya anyị na-elegide otu ebe?
5 Ọ chọrọ ịnọgide na-eme mgbalị iji guzogide Setan, ụwa ya nke hụrụ ihe onwunwe n’anya, na anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè. Kama ikwe ka anya anyị na-awagharị, ka anyị lekwasị ha n’ime uche Chineke nakwa n’olileanya anyị dị oké ọnụ ahịa nke ndụ ebighị ebi.—Ilu 4:25; 2 Kọr. 4:18.