Ntụleghachi Nke Usoro Ihe Omume Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
A ga-eji ajụjụ ndị dị n’isiokwu a mee ihe ná Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe obere oge tupu ọgbakọ agaa mgbakọ pụrụ iche maka afọ 2006 nakwa oge na-adịghị anya ha lọtasịrị. Onyeisi oche ndị nlekọta ga-eme ndokwa maka ntụle a a ga-eme tupu nakwa mgbe a lọtasịrị mgbakọ sekit, dị ka e si kọwaa ya n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2004, peeji nke 4. Mgbe a na-eme ntụleghachi ndị ahụ, e kwesịrị ịjụ ajụjụ a nile, na-adọrọ uche gaa n’otú anyị pụrụ isi tinye ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ n’ọrụ.
NNỌKỌ NKE ỤTỤTỤ
1. Gịnị ka mmadụ ilegide anya otu ebe pụtara, gịnịkwa mere o ji bụrụ ihe siri ike omume taa? (“Gịnị Mere Ị Ga-eji Legide Anya Otu Ebe?”)
2. Olee otú anyị si erite uru n’ilegide anya otu ebe? (“Nweta Ngọzi Ndị Na-esi n’Ilegide Anya Otu Ebe Pụta”)
3. Olee ihe ize ndụ dị n’ọtụtụ ihe ndị a na-ewere dị ka ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị? (“Ilegide Anya Otu Ebe n’Ụwa Ajọ Omume”)
NNỌKỌ NKE EHIHIE
4. Olee otú ndị mụrụ ụmụ na ndị ọzọ pụrụ isi gbaa ndị ntorobịa ume ịchụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ? (“Ndị Mụrụ Ụmụ Bụ́ Ndị Na-atụzi Àkụ́ Ha Atụzi” na “Ndị Ntorobịa Ndị Na-achụso Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ”)
5. Olee otú anyị nile (a) n’otu n’otu? (b) dị ka ezinụlọ? (ch) dị ka ọgbakọ? pụrụ isi na-eso nzukọ Jehova na-aga n’ihu? (“Lekwasị Anya n’Iso Nzukọ Jehova Na-aga n’Ihu”)