Anya Gị Ọ̀ Na-elegide Otu Ebe?
1. Gịnị ka mmadụ ‘ilegide anya otu ebe’ pụtara?
1 Ebe anyị lekwasịrị anya na-eso ekpebi ihe anyị na-eme. Ọ bụ ya mere ihe a Jizọs kwuru ji daba nnọọ adaba! Ọ sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị dum ga-ejupụta n’ìhè.” (Mat. 6:22) Ọ bụrụ na anya anyị ‘elegide otu ebe’ otú ahụ Jizọs kwuru, ọ pụtara na ọ na-elegide otu ihe, ya bụ, ime uche Chineke. Anyị ga-ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị, anyị agaghịkwa ekwe ka ịchụ akụnụba ma ọ bụ ihe ndị na-adịghị mkpa na-egbochi anyị ịga ozi ọma.
2. Gịnị nwere ike ime ka anyị chewe na ihe ụfọdụ dị anyị mkpa, ma gịnị ga-enyere anyị aka?
2 Ọ Dị Mkpa Ka Anyị Nyochaa Onwe Anyị: Anyị nwere ike ichewe na ọ dị mkpa na anyị ga-enwe ihe ụfọdụ ma anyị nụ ka a na-akpọsa ha na tiivi ma ọ bụ na redio ma ọ bụkwanụ ma anyị hụ na ndị ọzọ nwere ha. Tupu anyị emewe ihe ọ bụla ma ọ bụ zụwa ihe ọ bụla ga-eri anyị oge, ego, ma ọ bụ na-eme ka ike gwụ anyị, ọ ga-adị mma ka anyị “gbakọọ ihe ọ ga-efu.” Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị sị, ‘Ihe a m chọrọ ime ma ọ bụ ịzụ ọ̀ ga-eme ka m jiri ofufe Jehova kpọrọkwuo ihe ka ọ̀ ga-eme ka m leghara ya anya?’ (Luk 14:28; Fil. 1:9-11) Ọ dịkwa mma anyị nọtụ, anyị eleba anya n’ihe ndị anyị na-eme iji mara ma ànyị ga-akwụsịlata ịchụ ego ma nwekwuo ohere ịga ozi ọma.—2 Kọr. 13:5; Efe. 5:10.
3. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka nwanna nwaanyị ahụ hapụrụ ọrụ ọ na-arụ ụbọchị niile?
3 Mgbe otu nwanna nwaanyị malitere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, ọ kwụsịghị ọrụ ego ọ na-arụ ụbọchị niile n’agbanyeghị na o nwee ọrụ ọ ga na-arụ ụbọchị ụfọdụ, ọ ga-enwe ego ga na-ezuru ya igbo mkpa ya. Nwanna nwaanyị ahụ mechara, sị: “Ọ dịghị onye ga-abụ ohu nke nna ukwu abụọ. Amụtara m ịzụ ihe ndị dị m mkpa, ọ bụghị ihe ọ bụla anya m hụrụ. Achọpụtara m na ihe mmadụ zụrụ taa na-emecha mee ochie, nakwa na m chọwa inwetacha ihe ọ bụla masịrị m, ike ga-agwụ m.” Mgbe o lebachara anya n’ihe ndị ọ na-eme, ọ kwụsịlatara otú o si emefu ego, chọta ọrụ ọzọ na-agaghị na-ewecha oge ya, nke mere ka o nwee ike ịnọgide na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile.
4. Gịnị mere o ji dị oké mkpa na anyị ga-elegide anya otu ebe ugbu a?
4 Ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-elegide anya otu ebe bụ na oge agwụla agwụ. Ka chi na-eji ma na-abọ, otú ahụ ka ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a na-adịkwu nso, ụwa ọhụrụ Chineke ana-abịakwukwa nso. (1 Kọr. 7:29, 31) Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ikwusa ozi ọma, anyị ga-azọpụta onwe anyị, zọpụtakwa ndị na-ege anyị ntị.—1 Tim. 4:16.