Akụkụ nke 5: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Ikpebi Ókè Ihe A Ga-amụ Ga-aharu
1 Mgbe Jizọs na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe, o chebaara ókè ike ịghọta ihe ha haruru echiche, na-agwa ha okwu “ruo n’ókè ha nwere ike ige ntị.” (Mak 4:33; Jọn 16:12) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ dị ndị na-akụzi Okwu Chineke taa mkpa ịtụle ókè ihe a ga-amụ mgbe ha na-eduzi ọmụmụ Bible ga-aharu. Ókè ihe a ga-amụ ga-aharu ga-adabere n’ikike na ọnọdụ nke onye na-eduzi ọmụmụ ihe nakwa nke onye a na-eduziri ọmụmụ ihe.
2 Wusie Okwukwe Ike: Ọ pụrụ ịdị mkpa ka e duziere ụfọdụ ndị ọmụmụ ihe ugboro abụọ ma ọ bụ atọ tupu ha enwee ike ịghọta ihe ndị ọzọ a na-amụrụ ihe pụrụ ịghọta otu ugbo n’ụzọ dị mfe. Ọ ka mma ịhụ na onye a na-amụrụ ihe ghọtara ihe a na-amụ nke ọma karịa ịhụ na ọ mụchapụrụ akwụkwọ ya ngwa ngwa. Ọ dị mkpa ka onye ọ bụla a na-amụrụ ihe nwee ihe gbara ọkpụrụkpụ ọ ga-agbakwasị ụkwụ na ya wee kwere ihe ndị ọ na-amụta ọhụrụ n’Okwu Chineke.—Ilu 4:7; Rom 12:2.
3 Ka ị na-eduzi ọmụmụ ihe site n’izu ruo n’izu, na-etinye oge kwesịrị ekwesị n’inyere onye a na-amụrụ ihe aka ịghọta na ịnakwere ihe ọ na-amụta n’Okwu Chineke. Zere iduziri mmadụ ọmụmụ ihe ọkụ ọkụ bụ́ nke ga-eme ka ọ ghara irite uru zuru ezu n’eziokwu a na-akụziri ya. Wepụta oge iji mee ka isi ihe ndị dị n’ihe ọmụmụ ahụ doo anya na iji tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ihe ọmụmụ ahụ gbakwasịrị ụkwụ na ha.—2 Tim. 3:16, 17.
4 Mee Ka Ọmụmụ Ihe ahụ Na-aga Aga: Ọ bụ ezie na anyị kwesịrị izere iduzi ọmụmụ ihe ọkụ ọkụ, anyị kwesịkwara izere ịbụ ndị a dọpụrụ uche ha. Ọ bụrụ na onye a na-eduziri ọmụmụ ihe na-ekwukarị okwu banyere mkpa ya, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị mee ndokwa ikwurịta ya mgbe a mụchara ihe.—Ekli. 3:1.
5 N’aka nke ọzọ, ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere maka eziokwu ahụ pụrụ ime ka o siere anyị ike izere ikwu ọtụtụ okwu mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ ihe. (Ọma 145:6, 7) Mgbe ụfọdụ, ịkọ ahụmahụ ma ọ bụ ikwu ihe ndị na-adịghị n’akwụkwọ a na-amụ, bụ́ ndị metụtara ihe ọmụmụ ahụ, pụrụ ime ka e ritekwuo uru na ya, ma anyị agaghị achọ ka ha dị ọtụtụ ma ọ bụ too ogo nke na ha ga-egbochi onye a na-amụrụ ihe ịghọta ozizi ndị bụ́ isi nke Bible nke ọma.
6 Site n’ịmụ ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị mgbe ọ bụla anyị na-eduzi ọmụmụ ihe, anyị ga-enyere ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible aka ‘ijegharị n’ìhè Jehova.’—Aịsa. 2:5.