Nọgidenụ Na-ewulirịta Ibe Unu Elu
1 Pọl onyeozi mere ihe nile o nwere ike ime iji wusie ndị kwere ekwe ibe ya ike. (Ọrụ 14:19-22) N’otu aka ahụ, ọ na-emetụ anyị n’ahụ́ mgbe ụmụnna anyị nọ n’ọnọdụ ọjọọ, anyị na-achọkwa inyere ha aka. Bible na-ekwu na mmadụ nile, ọ bụghị nanị ndị okenye, kwesịrị inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. (Rom 15:1, 2) Tụlee ụzọ abụọ anyị pụrụ isi ṅaa ntị na ndụmọdụ a e ji ịhụnanya nye, nke bụ́: “Nọgidenụ na-akasirịta ibe unu obi ma na-ewulirịta ibe unu elu.”—1 Tesa. 5:11.
2 Na-achọpụta Mkpa nke Ndị Ọzọ: Okwu Chineke na-akọ na Dọkas “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere.” (Ọrụ 9:36, 39) Ọ rịbara ndị nọ ná mkpa ama ma mee ihe nile o nwere ike ime iji nyere ha aka. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya o setịpụụrụ anyị! Ị pụrụ ịnụ na otu nwanna katarala ahụ́ chọrọ onye ga na-ebuga ya ná nzukọ ọgbakọ. Ma ọ bụkwanụ a pụrụ inwe onye ọsụ ụzọ nke na-enweghị onye ya na ya ga-eso eje ozi n’otu ehihie n’etiti izu. Ọ bụrụ na ị chọpụta onye nọ ná mkpa dị otú ahụ ma nyere ya aka, legodị ụdị agbamume nke ahụ ga-abụrụ ya!
3 Mkparịta Ụka Ime Mmụọ: Anyị pụkwara iwuli ndị ọzọ elu site n’okwu anyị. (Efe. 4:29) Otu okenye nwere ahụmahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgba ndị ọzọ ume, na-ekwu banyere ihe ime mmụọ. Iji malite mkparịta ụka na-ewuli elu, ị pụrụ ịjụ ajụjụ dị mfe, dị ka ‘Olee otú i si chọta eziokwu ahụ,’?” Nwee ezigbo mmasị n’ebe ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ nọ. Gakwuru ndị dara mbà n’obi na ndị pụrụ ịdị na-eme ihere ma nyere ha aka. (Ilu 12:25) Ekwela ka ikwurịta banyere ntụrụndụ ụwa napụ gị oge gị na ndị kwere ekwe ibe gị ga na-eji ekwurịta ezigbo ihe ime mmụọ.—Rom 1:11, 12.
4 Ma, olee ihe ị pụrụ ikwu iji na-ewuli ndị ọzọ elu? Mgbe ị na-agụ Bible ma ọ bụ na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, ọ̀ dị ụkpụrụ ị chọpụtara na nso nso a nke mere ka i nwekwuo ekele n’ebe Jehova nọ? È nwere ihe ị nụrụ n’okwu ihu ọha ma ọ bụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke kpaliri gị ime ihe? Ka è nwere ahụmahụ na-ewusi okwukwe ike ị nụrụ nke metụrụ gị n’obi? Ọ bụrụ na i jiri akụ̀ ime mmụọ ndị dị otú ahụ kpọrọ ihe, ị ga-enwe ihe na-ewuli elu ị ga na-agwa ndị ọzọ mgbe nile.—Ilu 2:1; Luk 6:45.
5 Ka anyị nọgide na-ewulirịta ibe anyị elu site n’inyere ha ezigbo aka na iji ire anyị na-ekwu okwu ndị amamihe dị na ha.—Ilu 12:18.