Na-eme Ihe Ọma Ma Na-eso Ndị Ọzọ Ekerịta Ihe
1 Dọkas “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere.” (Ọrụ 9:36, 39) Mmụọ mmesapụ aka ya mere ka ma Jehova Chineke ma ndị maara ya hụ ya n’anya. Ndị Hibru 13:16 na-ekwu, sị: “Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” Olee otú anyị pụrụ isi na-eme ihe ọma ma na-eso ndị ọzọ ekerịta ihe taa?
2 Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee ka ndị ọzọ rite uru n’aka anyị bụ site n’iso ha na-ekerịta ‘akụ̀’ anyị. (Ilu 3:9) Onyinye anyị na-enye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ na-eme ka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ n’ụwa nile kwe omume. Mmesapụ aka anyị emewo ka ọtụtụ nde mmadụ bụrụ ndị e ziri ụzọ Chineke nakwa ndị na-enwe mkpakọrịta ime mmụọ na-ewuli elu.
3 Inye Nkasi Obi: Mgbe e nwere ọdachi, ndị Jehova na-adị njikere ịdị “na-eme ihe ọma” n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ nakwa n’ebe ndị anyị na ha na-adịghị ekpe otu okpukpe nọ. (Gal. 6:10) Mgbe otu ihe gbawasịrị n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta kemikal na France, otu di na nwunye nke bidewere ụlọ ọrụ ahụ kwuru, sị: “Ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst gbataara anyị ọsọ enyemaka ozugbo iji kpopụsịa ụmụ mkpọmkpọ na mkpọmkpọ juru n’ụlọ anyị nakwa n’ụlọ nke ndị ọzọ. O juru ndị agbata obi anyị anya ịhụ na ọtụtụ mmadụ bịara nyere anyị aka.” Nwanna nwanyị ọzọ kwukwara, sị: “Ndị okenye gbataara anyị ọsọ enyemaka. Ha bịara gbaa anyị ume. N’eziokwu, nke a bụ ihe dị anyị mkpa karịa enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe.”
4 Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi meere ndị agbata obi anyị ihe ọma, ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi nyere ha aka bụ site n’ime ka ha mara eziokwu ahụ dị oké ọnụ ahịa, bụ́ nke gụnyere “olileanya ndụ ebighị ebi” nke Jehova n’onwe ya kwere ná nkwa. (Taị. 1:1, 2) Ozi Bible na-ewetara ndị na-eru újú n’ihi ọnọdụ ụwa na n’ihi mmehie ha, ezi nkasi obi. (Mat. 5:4) Ka anyị na-eme ihe ọma ma soro ndị ọzọ na-ekerịta ihe mgbe ọ dị n’ike aka anyị ime ya.—Ilu 3:27.