Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite April 11
Abụ nke 4
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa April. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 15 na Teta! nke May 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke May 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa na-agba àmà okporo ámá.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
15 min: “Nọgidesie Ike n’Ọrụ Nkwusa.”a Dị ka oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.
Abụ nke 47 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 18
Abụ nke 76
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 8.”b Mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe onye nkwusa na-enye onye ọ ka malitere ọhụrụ iduziri ọmụmụ Bible broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? Onye nkwusa ahụ adọrọ uche gaa na foto dị na peeji nke 20 nke broshuọ ahụ ma kọwaara onye ahụ ọ na-amụrụ ihe n’ụzọ dị mkpirikpi banyere Okwu Ihu Ọha. Ya ekwuo isiokwu nke Okwu Ihu Ọha a ga-ekwu n’izu na-abịanụ ma gbaa onye ahụ ọ na-amụrụ ihe ume ịbịa.
15 min: Ibi Ndụ n’Uche Zuru Okè n’Ụwa nke E Nwere Ngwá Electronic. (Taịtọs 2:11, 12) Okwu dabeere n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2002, peeji nke 8, paragraf nke 1-7, nakwa n’Ozi Alaeze Anyị nke November 1999, peeji nke 5, paragraf nke 24-26, nakwa peeji nke 6, paragraf nke 35-36. Dị ka oge kwere mee, a pụkwara ikwu isi ihe ndị ọzọ dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke November 1999 ma ọ bụrụ na ha metụtara ókèala unu.
Abụ nke 169 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 25
Abụ nke 111
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa April. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 1 na Teta! nke May 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke May 8, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi azaghachi mgbe e kwuru okwu a na-egbochi nkwurịta okwu, nke bụ́, “Enweghị m mmasị.” (Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Gaa n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 8.) Kwuo isiokwu ndị nọ n’ókèala unu pụrụ inwe mmasị na ha ngwa ngwa.
30 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Irubere Chineke Isi’ nke Ndịàmà Jehova nke 2005.”c Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 2, gụọ akwụkwọ ozi April 1, 2005, nke kwuru mgbakọ e kenyere ọgbakọ unu. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, tụlee isi ihe nile dị n’igbe ndị ahụ dị na peeji nke 4. Gbaa mmadụ nile ume ịmalite ime ndokwa maka mgbakọ distrikti, ngwa ngwa o kwere mee.
Abụ nke 79 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 2
Abụ nke 148
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Na-eme Ihe Ọma Ma Na-eso Ndị Ọzọ Ekerịta Ihe.”d Gosi ụzọ a pụrụ isi tinye ihe ndị e kwuru n’isiokwu ahụ n’ọrụ n’ókèala unu, na-ekwu ụzọ ndị dị irè anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka.
20 min: Jiri Broshuọ Ọhụrụ ahụ Na-akpalikwu Mmasị. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Anyị kwesịrị ịgaghachi na nke onye ọ bụla natara broshuọ Nọrọ na Nche! iji kpalikwuo mmasị ya. Jiri isiokwu ndị dị n’ime broshuọ ahụ, bụ́ ndị e depụtara na peeji nke 2, chịkọta isi ihe dị na broshuọ ahụ, na-adọrọ uche gaa n’akụkụ ndị ahụ dị ka igbe bụ́ ndị e ji àgwà pụrụ iche mee ka ha pụta ìhè (ndị e depụtara isiokwu ha n’okpuru isiokwu ndị ahụ e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo). A pụrụ iji akụkụ ndị a nwee mkparịta ụka dị mkpirikpi ma rijuo afọ, bụ́ ndị ga-ehinye ájá ná mkparịta ụka ndị e nwere n’oge gara aga. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a mụrụ peeji nke 3-4 n’oge mbụ e zutere mmadụ, a pụrụ iji akụkụ ahụ dị ka igbe nke isiokwu ya bụ “Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?” bụ́ nke dị na peeji nke 5, mee nletaghachi. Kwurịtanụ otú a pụrụ isi mee ya. Tụlee akụkụ ndị ọzọ dị ka igbe, dị ka ndị nke dị na peeji nke 6-8 nakwa peeji nke 17-18, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ dabara n’ókèala unu. Mee ihe ngosi nke ebe e ji otu n’ime isiokwu ndị ahụ dị ka igbe mee nletaghachi. E kwesịrị ịgụ ma kọwaa otu ma ọ bụ karịa n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Onye nkwusa emechie okwu ya site n’ịdọrọ uche gaa n’akụkụ ọzọ dị ka igbe bụ́ nke ha ga-atụle n’oge ọzọ ọ ga-abịa.
Abụ nke 66 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.