Akụkụ nke 8: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Iduru Ndị A Na-amụrụ Ihe Bịa ná Nzukọ Jehova
1. N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịkọrọ onye ị na-amụrụ ihe otu ihe banyere nzukọ Jehova kwa izu n’oge unu na-amụ ihe?
1 Nzube anyị ji eduzi ọmụmụ Bible abụghị nanị iji kụziere ndị ọzọ ozizi Bible kamakwa ọ bụ iji nyere ha aka ịbata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Zek. 8:23) Broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? pụrụ inyere anyị aka ime nke a. Nye ya ndị ọhụrụ ị na-amụrụ ihe ma gbaa ha ume ịgụ ya. Tụkwasị na nke a, na-ewepụta minit ole na ole kwa izu n’oge unu na-amụ ihe iji kọọrọ ha otu ihe banyere nzukọ Jehova.
2. Olee otú ị pụrụ isi gbaa ndị ị na-amụrụ Bible ume ịbịa nzukọ ọgbakọ?
2 Nzukọ Ọgbakọ: Ụzọ bụ́ isi ndị a na-amụrụ Bible na-esi aghọta nzukọ Chineke bụ site n’iso anyị na-aga nzukọ ọgbakọ. (1 Kọr. 14:24, 25) N’ihi ya, ị pụrụ ịmalite ime ka ha ghọta nke a site n’ịkọwara ha nzukọ ise ndị anyị na-enwe kwa izu, na-akọwara ha ya otu otu. Gwa ha isiokwu okwu ihu ọha ọzọ a ga-ekwu. Gosi ha ihe a ga-amụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nakwa n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Kọwaara ha ihe a na-amụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa ná Nzukọ Ije Ozi. Mgbe i nwere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ikekwe ị pụrụ ịmụgharị ya n’ihu ha. Kọọrọ ha isi ihe ndị e kwuru ná nzukọ ọgbakọ. Jiri foto ndị dị n’akwụkwọ anyị nyere ha aka ịhụ ihe a na-eme ná nzukọ anyị. Malite n’ụbọchị mbụ i duziere ha ọmụmụ ihe gbawa ha ume ịbịa nzukọ.
3. Olee ihe ndị metụtara nzukọ Jehova bụ́ ndị anyị pụrụ ịkọrọ ndị anyị na-amụrụ ihe?
3 Mgbe Ememe Ncheta, mgbakọ, na ọbịbịa onye nlekọta sekit na-eru nso, wepụta minit ole na ole n’oge unu na-amụ ihe iji kọwaara ha banyere ndokwa ndị a ma mee ka ha tụsiwe anya ha ike. Jiri nke nta nke nta na-aza ajụjụ ha ndị dị ka: Gịnị mere e ji akpọ anyị Ndịàmà Jehova? N’ihi gịnị ka anyị ji akpọ ebe anyị na-anọ enwe nzukọ, Ụlọ Nzukọ Alaeze? Olee ihe bụ́ ọrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi? Olee otú e si ahazi ọrụ nkwusa nakwa ókèala ndị anyị na-eje ozi ọma na ha? Olee otú e si ebipụta akwụkwọ anyị? Olee otú e si enweta ego e ji na-akwado nzukọ a? Gịnị bụ ọrụ alaka ụlọ ọrụ na Òtù Na-achị Isi na-arụ n’ilekọta ọrụ nkwusa?
4, 5. Olee otú vidio anyị pụrụ isi mee ka a ghọta nzukọ Jehova?
4 Vidio Ndị E Ji Akụzi Ihe: Ụzọ ọzọ ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible pụrụ isi ghọta nzukọ dị ebube nke Jehova bụ site na vidio anyị. Vidio bụ́ To the Ends of the Earth na-egosi ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ anyị na-arụ, Our Whole Association of Brothers na-egosi òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ, ebe United by Divine Teaching na-egosi ịdị n’otu nke Ndịàmà Jehova. Ka otu nwanyị nọworo na-anata magazin anyị na akwụkwọ anyị ndị ọzọ ruo afọ ise kirisịrị vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name, anya mmiri gbara ya. Ọ tụkwasịwo Ndịàmà na-abịa n’ụlọ ya obi, ma mgbe o kirisịrị vidio ahụ, ọ bịara chọpụta na ya pụrụ ịtụkwasịkwa nzukọ Jehova obi. A malitere iduziri ya ọmụmụ Bible, n’izu na-esonụ, ọ gakwara nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
5 Site n’iwepụta minit ole na ole kwa izu n’oge anyị na-amụ ihe iji na-akọwara ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible banyere nzukọ Jehova ma jiri ngwá ọrụ ndị nzukọ Jehova wepụtara na-eme ihe, anyị pụrụ iji nke nta nke nta duru ha bịa ná nzukọ Jehova ji na-eme ihe taa.