Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi” nke Ndịàmà Jehova nke 2005
1 Jehova Chineke, bụ́ Onye Nkụzi Ukwu anyị, na-eme ndokwa ka anyị gbakọọ iji bụrụ ndị a kụziiri ụzọ ya. (Aịsa. 30:20, 21; 54:13) Ọ na-eme nke a site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, bụ́ nke na-eme ndokwa maka nzukọ ndị dị ka mgbakọ distrikti anyị na-enwe kwa afọ. (Mat. 24:45-47) Anyị nwere mmetụta yiri nke ọbụ abụ bụ́ Devid, onye bụrụ, sị: “N’ime mkpọkọta mmadụ nile ka m ga-agọzi Jehova.” (Ọma 26:12) Devid ghọtara nke ọma uru ịbụ onye Jehova ziri ihe bara, o kpebisikwara ike ịnọ n’etiti ndị Ya mgbe ọ bụla ha gbakọtara.
2 Ị̀ ga-eso ná “mkpọkọta mmadụ nile” bụ́ ndị ga-aga Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi,” nke afọ a? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ọmụma ndị na-esonụ ga-abara gị uru ka ị na-akwadebe ịga.
3 Mee Atụmatụ Ugbu A Ịga Ụbọchị nke Ọ Bụla: “Echiche [atụmatụ, NW] nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru.” (Ilu 21:5) Okwu ndị ahụ ọ́ dịghị egosi uru ime atụmatụ n’oge maka ịga mgbakọ distrikti a bara? Iji jide n’aka na ọ dịghị nke ọ bụla ga-akwa gị n’ime ihe omume ime mmụọ ahụ ga-enye ume ọhụrụ, jiri amamihe malite ugbu a mewe ndokwa ọ bụla dị mkpa iji gazuo ụbọchị atọ ahụ. Ọ bụrụ na ị ga-anata onye were gị n’ọrụ ikike iji hapụ ọrụ, mee ya ozugbo. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ị ga-eso di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekweghị ekwe kwurịta banyere atụmatụ ị na-eme, ahapụla ya ruo mgbe oge mgbakọ ruru. Ihe ịma aka ọ bụla i nwere, gwa ya Jehova n’ekpere, na-enwe ntụkwasị obi na site n’enyemaka ya, atụmatụ gị ‘ga-eguzosi ike.’ (Ilu 16:3) Ọzọkwa, ọ ga-adị mma ka i nyere ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible aka ime nkwadebe iji nọrọ ya ná nnọkọ nke ọ bụla.
4 Ebe Obibi: Iji mee ka ị tụsara ahụ́, a ga-eme ndokwa maka ụlọ obibi n’obodo nke ọ bụla a ga-enwe mgbakọ na ya. N’ọtụtụ ala mgbakọ, a na-enye ndị mmadụ ụlọ n’ala mgbakọ, ma ọ́ bụghị ụlọ na-abụghị ezigbo ya, ọ bụrụ ezigbo ụlọ a rụrụ maka obibi. Biko burunụ n’uche na nzukọ a agaghị enwe ike ịrụ ụlọ obibi ga-ezuru ndị nile bịara mgbakọ. Ọ bụ nanị ndị Ngalaba Ụlọ Obibi nyere ụlọ n’ala mgbakọ kwesịrị ibi na ya. Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ebe ọzọ, i kwesịrị ikwenyere Ngalaba Ụlọ Obibi ma biri n’ụlọ e nyere gị. Chetakwa na ọ pụrụ ifutụ gị ego iji na-abịa n’ala mgbakọ ma na-ala kwa ụbọchị. Ọ dị mkpa iburu nke a n’uche mgbe ị na-akpakọ ego maka mgbakọ. Tupu i dejupụta fọm Room Request, tụleghachi isi ihe ndị dị n’igbe bụ́ “Ụzọ Ị Pụrụ Isi Kwadoo Ndokwa Ndị E Mere Maka Ụlọ Obibi.” Ozugbo ị tụleghachisịrị ya, tụleghachikwa ihe ndị e kwuru n’igbe bụ́ “Olee Ụzọ Kasị Mma Isi Nweta Ụlọ Obibi?”
5 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Pọl onyeozi kọwara ụfọdụ ụmụnna dị ka ndị bụụrụ ya ndị ‘enyemaka mere ka ọ dị ike.’ (Kọl. 4:7-11) Otu n’ime ụzọ ndị ha si nyere Pọl aka bụ site n’igboro ya mkpa ya ụfọdụ. Olee otú ị pụrụ isi bụrụ onye ‘enyemaka na-eme ka ndị ọzọ dị ike’ n’ihe banyere mgbakọ distrikti a? Enyemaka pụrụ ịdị ndị nkwusa merela agadi, ndị nke na-adịkwaghị ike, ndị nọ n’ozi oge nile, na ndị ọzọ mkpa n’ihe banyere ụgbọ njem ma ọ bụ ụlọ obibi. Ọ bụ ndị ikwu ha ka ọ kasị dịrị n’aka igbo mkpa ha. (1 Tim. 5:4) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị ikwu ha apụghị igbo mkpa ha, ndị kwere ekwe ibe ha pụrụ inyere ha aka. (Jems 1:27) Ndị nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ilebara ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche n’ìgwè ọmụmụ ihe ha anya iji jide n’aka na ha mere ndokwa nile dị mkpa n’ezi oge tupu mgbakọ ahụ eruo.
6 E mere ndokwa maka mkpa pụrụ iche nanị maka ndị ọ dị mkpa ka ndị ọzọ nyere aka n’ụzọ pụrụ iche n’ime ndokwa maka mgbakọ, karịsịa ndokwa maka ụlọ obibi. Enyemaka pụkwara ịdị ha mkpa n’ụzọ ndị ọzọ, dabere n’ụdị ọnọdụ ha nọ na ya. Ndị ruru eru inweta enyemaka ná ndokwa nke Mkpa Ndị Pụrụ Iche bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ na-esetịpụ ezi ihe nlereanya, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị nwere mkpa pụrụ iche, ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadokwara na ha ruru eru. Ọgbakọ nke ndị nwere mkpa pụrụ iche nọ na ya kwesịrị ime ndokwa ilekọta ha n’ụzọ ndị ọzọ, kama iburu ibu ahụ bokwasị ndị na-ahazi mgbakọ.
7 Ije Mgbakọ Ọzọ: Iji hụ na e nwere oche, akwụkwọ, ụlọ obibi, na ihe ndị ọzọ ga-ezuru ndị bịara mgbakọ, a na-agba ndị nkwusa ume ịga mgbakọ e kenyere ọgbakọ ha. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị achọọ na ị ga-aga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ gị, ya abụrụkwa na ị chọrọ ka e nye gị ụlọ, biko gakwuru odeakwụkwọ ọgbakọ unu ka o nye gị fọm Room Request. Ziga fọm gị n’adres kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na a ga-enwe mgbakọ abụọ ma ọ bụ karịa n’obodo ahụ, jide n’aka na i dere akara ụbọchị nke mgbakọ ị chọrọ ịga.
8 A Chọrọ Ndị Ọrụ Afọ Ofufo: Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya bụ́ ịgba n’iji obi umeala na-achọpụta ihe na-akpa ndị ọzọ ma lebara ha anya. (Luk 9:12-17; Jọn 13:5, 14-16) Ndị na-ewepụta onwe ha n’afọ ofufo ịrụ ọrụ n’ala mgbakọ na-egosipụta mmụọ yiri nke ahụ. Iji gboo mkpa ndị a ga-enwe ná ngalaba dị iche iche nke mgbakọ, Kọmitii Mgbakọ dị n’obodo unu ga-amalite n’oge na-adịghị anya ịkpọ ndị ọzọ iso ha rụọ ọrụ. Ọ dị mkpa karịsịa ka ndị okenye wepụta onwe ha ma nakwere ọrụ e kenyere ha. Mmụọ nke iwepụta onwe ha n’afọ ofufo ga-abụrụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ezi ihe nlereanya.—1 Pita 5:2, 3.
9 Ihe Ndị Ọzọ Na-ahụ: Otu manịja na-ahụ maka ire nri n’otu họtel kwuru, sị: “Unu bụ ndị ahịa anyị kasị enwe mmasị na ha. Unu na-akpa nnọọ ezi àgwà karịa òtù ọ bụla ọzọ. Ndị ọrụ anyị na-ekwukarị okwu ọma banyere ụzọ unu si emeso ha omume ọma. N’ezie, onye ọ bụla na-achọ ịrụ ọrụ ná ngwụsị izu ọ bụla unu bịara ebe a!” Onye ọzọ na-ekwuchitere otu họtel ọnụ ya kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova bụ òtù anyị na-adịtụghị enwe nsogbu iso mekọọ ihe.” Ikekwe àgwà ọma gị so mee ka ha kwuo ihe ndị ahụ ha kwuru. Chegodị echiche ụdị obi ụtọ Jehova na-aghaghị inwe mgbe ọ hụrụ anyị ka anyị na-akpa àgwà n’ụzọ na-ewetara ya ụdị otuto a!—1 Pita 2:12.
10 Site n’aka “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi,” Jehova Chineke emewo ndokwa ka ndị ya gbakọọ iji nara ntụziaka ime mmụọ n’afọ a. (Luk 12:42) Ọ ga-achọ mgbalị iji mee ndokwa ịgazu ụbọchị atọ ahụ, ma ọ ga-eru mgbalị ọ bụla e mere maka ya. Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi” nke afọ a ga-emerịrị ka mkpebi anyị mere ijere Jehova ozi ugbu a nakwa mgbe nile ebighị ebi sikwuo ike. Ka anyị kpebisie ike ịgbaso ndụmọdụ ọbụ abụ ahụ, nke bụ́: “N’ime mkpọkọta nile nke mmadụ gọzienụ Chineke.”—Ọma 68:26.
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday na Saturday
9:20 ụtụtụ - 4:50 uhuruchi
Sunday
9:00 ụtụtụ - 3:20 uhuruchi
Igbe dị na peeji nke 4]
Ụzọ Ị Pụrụ Isi Kwadoo Ndokwa Ndị E Mere Maka Ụlọ Obibi
◼ Were ụlọ Ngalaba Ụlọ Obibi nyere gị. Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ebe Ngalaba Ụlọ Obibi nyere gị. Ekwela ka ọnụ ọgụgụ ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru.
◼ Agala n’ebe ndị nwe ụlọ e nyere gị na-achọghị ka ndị mmadụ na-aga. Sie nri nanị ma ọ bụrụ na e nyere gị ikike ime otú ahụ, siekwa ya nanị n’ebe a kwadoro ka ị nọrọ sie ya.
◼ E kwesịrị izigara Ngalaba Ụlọ Obibi fọm Room Request n’ezi oge. Nke a ga-eme ka Ngalaba Ụlọ Obibi nwee nnọọ oge ha ga-eji chọtara gị ụlọ dị mma.
◼ I kwesịrị idepụta ihe nile ị ga-ede na fọm Room Request nke ọma otú a ga-agụta ihe i dere.
Igbe dị na peeji nke 4]
Olee Ụzọ Kasị Mma Isi Nweta Ụlọ Obibi?
1. Nata odeakwụkwọ ọgbakọ unu fọm Room Request.
2. Dejupụta fọm Room Request n’ezi oge. Biko hụ na i dere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, nakwa ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ụlọ obibi ọ̀ bụ ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ.
3. Odeakwụkwọ kwesịrị inyocha fọm Room Request ahụ iji mara ma è deziri ya edezi. Ọ bụrụ na e deziri ya edezi, o kwesịrị ịbịanye aka na ya ma ziga ya n’obodo a ga-enwe mgbakọ ahụ, Ọ BỤGHỊ N’ALAKA ỤLỌ ỌRỤ. Nke a bụ n’ihi na e nwere ike ọ gaghị eru n’oge ma e si n’aka alaka ụlọ ọrụ ziga ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ, ụmụnna na-esi na Steeti Lagos zitere alaka ụlọ ọrụ fọm ka alaka ụlọ ọrụ jiri aka ha ziga fọm ndị ahụ ná mgbakọ a ga-enwe na Steeti Lagos. Ọ gaara aka mfe ma kara ruo ngwa ma e ziga fọm ndị ahụ kpọmkwem n’ala mgbakọ nke ahụ ha chọrọ ịga na Steeti Lagos kama isi n’aka alaka ụlọ ọrụ ziga ha.
4. Agwala onye nwe ụlọ ka ị kwụọ ya ego karịrị nke ya na Ngalaba Ụlọ Obibi kwekọrịtara ka i wee nweta ụlọ ahụ.
5. Mgbe i ji aka gị na-achọ ụlọ obibi, biko chọpụta ma Ngalaba Ụlọ Obibi ò kwuola okwu ụlọ ahụ iji zere inweta ụlọ ha kwurula okwu ya.