Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/05 p. 1
  • Nọgidesie Ike n’Ọrụ Nkwusa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgidesie Ike n’Ọrụ Nkwusa
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-eme Nkwusa!
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • “Toonụ Aha Jehova”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Na-eto Jehova Mgbe Nile
    Ozi Alaeze Anyi—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 4/05 p. 1

Nọgidesie Ike n’Ọrụ Nkwusa

1 Oge dị oké egwu abịawo. Agha obodo, agha agbụrụ, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na ihe ndị ọzọ na-eyi egwu juru ebe nile. Ozi ọma dị ụmụ mmadụ mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ma, ọtụtụ mmadụ adịghị enwe mmasị n’ihe ime mmụọ. N’ebe ụfọdụ, ọ na-esi nnọọ ike ịchọta ndị mmadụ n’ụlọ, ọ na-akadị esi ike inweta ndị ga-ege anyị ntị ma ọ bụ ndị chọrọ ịmụ Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị mkpa ka anyị nọgidesie ike na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobeworo.—Mat. 24:14.

2 Ịhụnanya Maka Ndị Mmadụ: Ọrụ nkwusa anyị na-eme ka ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị mmadụ nọ pụta ìhè. “Ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.” (2 Pita 3:9; Ezik. 33:11) N’ihi ya, o nyewo iwu na, dị ka Jizọs kwuru, “a ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.” (Mak 13:10) Chineke na-arịọ ndị mmadụ ka ha lọghachikwute ya ma gbanahụ ikpe na-abịanụ nke a ga-ekpe ụwa Setan. (Joel 2:28, 29, 32; Zef. 2:2, 3) Obi ọ́ dịghị anyị ụtọ na Jehova nyere anyị ohere nke ikere òkè n’ọrụ dị otú ahụ?—1 Tim. 1:12, 13.

3 Akụkọ ozi ụwa nile nke afọ ije ozi 2004 gosiri na, ná nkezi, e duziri ọmụmụ Bible dị 6,085,387 kwa ọnwa, e meekwa ihe dị ka mmadụ 5,000, bụ́ ndị ka malitere amalite iso ụzọ Kraịst, baptizim kwa izu! A chọtara ụfọdụ n’ime ndị ọhụrụ a raara onwe ha nye n’ihi ngọzi Jehova gọziri mgbalị siri ike nke ndị nkwusa, bụ́ ndị nọgidere na-agba mbọ ịgwa onye ọ bụla nọ n’ókèala ha okwu. Lee ọṅụ nke ahụ meworo ka e nwee n’ọgbakọ! Leekwa ihe ùgwù ọ bụ ịbụ onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ a na-azọpụta ndụ!—1 Kọr. 3:5, 6, 9.

4 Ito Aha Chineke: Anyị na-anọgidesi ike n’ọrụ nkwusa iji too Jehova n’ihu ọha na iji doo aha ya nsọ n’ihu ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Hib. 13:15) Setan eduhiewo “ụwa dum mmadụ bi” ikwere na ike Chineke erughị n’idozi nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ, na ọ chọghị ịma banyere ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata, ma ọ bụkwanụ na Chineke adịghịdị adị. (Mkpu. 12:9) Site n’ọrụ nkwusa anyị na-arụ, anyị na-eme ka a mara ihe bụ́ eziokwu banyere Nna anyị nke eluigwe dị ebube. Ka anyị nọgide na-eto aha ya—ugbu a na mgbe nile ebighị ebi.—Ọma 145:1, 2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya