“Na-emesapụ Aka, Na-adị Njikere Ikerịta Ihe”
1 Ọtụtụ narị afọ gara aga, Pọl onyeozi nyere Timoti ntụziaka ka ọ gbaa ndị kwere ekwe ibe ya ume “ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile, [ka ha na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe, NW].” (1 Tim. 6:18) Pọl chetakwaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ka ha ghara ichezọ “ime ihe dị mma na ime ka [ha] na ndị ọzọ [kerịta] ihe [ha].” (Hib. 13:16) N’ihi gịnị ka o ji detuo ntụziaka ndị a? N’ihi na ọ maara na “otuto na nsọpụrụ na udo ga-adịrị onye ọ bụla nke na-arụ ezi ọrụ.”—Rom 2:10.
2 N’ihi ịbụ Onye Okike, Jehova Chineke bụ Onye Nwe ihe nile. (Mkpu. 4:11) Anyị nwere ekele n’ezie maka ihe o ji ihe onwunwe ya na-emere anyị. N’agbanyeghị omume na-egosi enweghị ekele nke ọtụtụ ndị n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, Onye Kasị Ihe Nile Elu nọgidere na-ekwe ka mmadụ nile na-erite uru site ná ndokwa ndị o ji mmesapụ aka na-eme maka ịkwado ndụ. (Mat. 5:45) O nyere ọbụna Ọkpara ya ọ hukarịsịrị n’anya dị ka àjà, ka anyị wee nwee ike inwe ndụ ebighị ebi. Ọ̀ bụ na ịhụnanya e gosiri anyị ekwesịghị ịkpali anyị igosipụta ekele anyị nwere site n’imesapụrụ ụmụ mmadụ ibe anyị aka?—2 Kọr. 5:14, 15.
3 Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ikerịta? Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị jiri ihe onwunwe ọ bụla anyị nwere mee ihe n’ụzọ ziri ezi n’anya Chineke. N’ezie, anyị kwesịrị ịkwado ọrụ Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ n’ụzọ ihe onwunwe na n’ụzọ ime mmụọ. N’ezie, ozi ọma ahụ bụ akụ̀ kasị baa uru mmadụ pụrụ inwe, n’ihi na ọ bụ “ike nke Chineke ruo nzọpụta.” (Rom 1:16) Site n’iji mmesapụ aka were oge na ihe onwunwe anyị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa na ọrụ nkụzi ihe kwa ọnwa, anyị pụrụ inwe ike isoro ndị ọzọ kerịta akụ̀ ime mmụọ, na-eduga ha n’inweta ndụ ebighị ebi.
4 Jehova na-enwe nnọọ obi ụtọ mgbe anyị na-enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka. O kwere nkwa inye ngọzi, ọ na-echetakwara anyị, sị: “Akụ̀ adịghị aba uru n’ụbọchị nke nrubiga ókè nke iwe: ma ezi omume na-anapụta n’ọnwụ.” (Ilu 11:4; 19:17) Iji ihe onwunwe akwado ọrụ Alaeze ahụ na ikere òkè zuru ezu n’ikwusa ozi ọma ahụ bụ ụzọ ndị magburu onwe ha anyị pụrụ isi gosi na anyị na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe.