Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/02 p. 3-4
  • “Baa Ọgaranya n’Ezi Ọrụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Baa Ọgaranya n’Ezi Ọrụ”
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • “Na-eme Ihe Ọma n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”
    Ozi Alaeze Anyi—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 3/02 p. 3-4

“Baa Ọgaranya n’Ezi Ọrụ”

1 N’afọ ndị ikpeazụ nke ozi o ji ịnụ ọkụ n’obi jee, Pọl onyeozi sooro Timoti na Taịtọs rụkọọ ọrụ n’ụzọ chiri anya. O degaara nke ọ bụla n’ime ha okwu agbamume ndị yiri ibe ha. Ọ gwara Taịtọs na “ndị ahụ kweworo na Chineke” kwesịrị ‘ịtụkwasị uche ha n’ịnọgide na-arụ ezi ọrụ.’ (Taị. 3:8) Ọ gwara Timoti na ndị tụkwasịrị olileanya ha n’ebe Chineke nọ kwesịrị ‘ịba ọgaranya n’ezi ọrụ.’ (1 Tim. 6:17, 18) Nke a bụ ndụmọdụ magburu onwe ya nye anyị nile! Ma gịnị ga-akwali anyị ịrụ ezi ọrụ ná ndụ anyị? Oleekwa kpọmkwem ọrụ ndị anyị pụrụ ịrụ n’ọdịnihu?

2 Ihe na-akwali anyị ịba ọgaranya n’ezi ọrụ bụ okwukwe na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ, nakwa olileanya magburu onwe ya o nyeworo anyị. (1 Tim. 6:19; Taị. 2:11) Karịsịa n’oge a n’afọ, a na-echetara anyị na Jehova zitere Ọkpara ya n’ụwa ka Jizọs wee nwee ike iwepụ Nna ya n’ụta nakwa iji megheere mmadụ nile kwesịrịnụ ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. (Mat. 20:28; Jọn 3:16) A ga-eme ka nke a doo nnọọ anya n’Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst na March 28. Ná mmeghachi omume nye olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi, ọ̀ bụ na a dịghị akwali anyị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji “baa ọgaranya n’ezi ọrụ”? N’ezie a na-akwali anyị! Olee ọrụ ndị anyị pụrụ ịrụ ugbu a?

3 Ezi Ọrụ Ndị A Ga-arụ na March na n’Ọnwa Ndị Ọzọ: N’ezie, anyị ga-aga Ememe Ncheta—ihe omume kasị mkpa n’afọ a nye Ndịàmà Jehova n’ụwa nile. (Luk 22:19) Ma anyị kwesịrị isoro ọtụtụ ndị mmadụ dị ka o kwere mee kerịta ọṅụ nke ememe ahụ. Lee anya n’akụkọ ozi dị n’Ụlọ Nche nke January 1, 2002, ị ga-ahụkwa na n’afọ gara aga n’ọtụtụ ala n’ụwa nile, ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta ji okpukpu atọ, anọ, ise, ma ọ bụ karịa, karịa ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. N’ezie, mmadụ nile nọ n’ọgbakọ tinyesiri mgbalị ike iji kesazuo akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta n’ókèala ha nile. Ya mere, anyị kwesịrị ịmalite ugbu a na-eru March 28, itinye oge dị ukwuu ruo ókè anyị nwere ike n’ịkpọ ndị mmadụ òkù ịbịa Ememe Ncheta, na-enyere ha aka ịmụta banyere olileanya nke nzọpụta.

4 N’ọnwa April, olee otú anyị pụrụ isi gaa n’ihu n’ọrụ ọma anyị maliterela n’ọnwa bu ya ụzọ, si otú ahụ “baa ọgaranya n’ezi ọrụ”? Ọ bụ site n’ịnọgide jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ ikwusa ozi ọma, bụrụ ndị “na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ.” (Taị. 2:14; Mat. 24:14) Ọ bụrụ na i nweghị ike ịsụ ụzọ inyeaka na March, ị̀ pụrụ ime otú ahụ n’April na/ma ọ bụ May? Ọ bụrụ na ị na-asụ ụzọ na March, ị̀ pụrụ ịga n’ihu?

5 Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ ego na-achọpụta na ha pụrụ itinye otu awa ma ọ bụ karịa n’ozi mgbe ha na-aga ọrụ, na-agba àmà okporo ámá ma ọ bụ na-akpọtụrụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ achụmnta ego ndị na-emepe n’isi ụtụtụ. Ndị ọzọ na-eme ndokwa iji ụfọdụ n’ime oge ha na-eji eri nri ehihie gbaa àmà. Ụfọdụ ahụwo na ha pụrụ iduziri onye ọrụ ibe ha ọmụmụ Bible n’oge ahụ. Ọtụtụ ụmụnna nwanyị bụ́ ndị odozi akụ̀ enwewo ike iwepụta oge maka ozi ubi mgbe ụmụ ha gara akwụkwọ. Site n’ibilite n’oge n’ụbọchị ụfọdụ iji rụọ ọrụ ụlọ ha, ha na-enwekwu oge n’ehihie maka ọrụ ime nkwusa na izi ihe.—Efe. 5:15, 16.

6 Ọ bụrụgodị na i nweghị ike ịsụ ụzọ inyeaka, ikekwe ị pụrụ ịhazi usoro ihe omume gị iji na-ekere òkè ka ukwuu n’ozi, na-eme ihe nile i nwere ike ime iji ‘na-arụ ọrụ ọma, baa ọgaranya n’ezi ọrụ, na-emesapụ aka, na-adị njikere isoro ndị ọzọ kerịta’ eziokwu ahụ.—1 Tim. 6:18.

7 Cheta Ọrụ Ọma nke Ime Ndị Na-eso Ụzọ: Kwa afọ, a na-enwe ndị nwere mmasị na-abịa Ememe Ncheta. Ọ̀ pụrụ ikwe mee ka ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ lebara ndị bịaranụ na-amụwabeghị ihe ugbu a anya? À pụrụ ịgara ha nletaghachi n’ebumnobi nke inyere ha aka inwe ọganihu ime mmụọ? Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime ndị a na-abịa Ememe Ncheta bụ ndị ikwu nke Ndịàmà. Ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị mụrụ ihe n’oge gara aga, ndị nanị ihe dị ha mkpa bụ agbamume iji maliteghachi ịmụ ihe na ịgachi nzukọ anya. Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụrụ anyị ịhụ ka ha so anyị bụrụ ndị ohu Jehova na-arụsi ọrụ ike!

8 Ọ bụrụ na anyị ekere òkè ka ukwuu n’ozi na March na ọnwa ndị ọzọ, o yikarịrị ka ànyị ga-achọtakwu ndị nwere mmasị anyị ga-akpọtụghachiri. Gbalịa ịjụ ha otu ajụjụ a ga-aza mgbe ọzọ. Mgbe ahụ kwee ha nkwa ịgwa ha azịza ya mgbe ị bịara. Ọ bụrụ na anyị emee nke a, ụzọ maka nletaghachi ga-eghere oghe. Ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na anyị nwee ike ịga nletaghachi ahụ ngwa ngwa. Ọ bụrụ na anyị enweghị ike ịmalite ọmụmụ ihe ná nleta mbụ, anyị kwesiṛị ịgbalị ịmalite otu kpọmkwem ná nleta ọzọ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.

9 Mgbe anyị na-ekere òkè n’ịgba àmà okporo ámá, anyị kwesịrị ịdị njikere itinye mgbalị n’ime ka anyị na ndị mmadụ kwurịta okwu. Ọtụtụ ndị nkwusa abụwo ndị ndị nwere mmasị ha zutere mgbe ha na-agba àmà n’okporo ámá nyere aha, adres, na nọmba telifon ha. Ọ bụrụ na onye ị kpọtụụrụ ebighị n’ókèala unu, nweta fọm bụ́ Please Follow Up (S-43) n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, dejupụta ya, ma nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ, bụ́ onye ga-eziga ya n’ọgbakọ nke onye ahụ bi n’ókèala ya. Ọ bụrụ na odeakwụkwọ agaghị emeli otú ahụ, ọ ga-ezitere ya alaka ụlọ ọrụ ka ha mee ihe banyere ya. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ ịzụlite mmasị ahụ.

10 Ọ bụrụ na onye ahụ nwere telifon, ọ bụrụkwa nọmba telifon ya ka e nwetara, kama ịbụ adres, mgbe ahụ, mee nletaghachi site n’ịkpọ onye ahụ na fon. Kwadebe ihe ị chọrọ ka unu tụlee tupu oge eruo. Debe akwụkwọ Reasoning nso maka iji chọta ihe ngwa ngwa. Ụfọdụ na-enwe ọganihu dị mma n’iduziri ndị mmadụ ọmụmụ ihe na fon, gụnyere ndị ọ na-esiri ha ike inweta n’ụlọ. Otu nwanna nwanyị malitere ịgwa ndị inyom nwere mmasị o zutere mgbe ọ nọ n’ozi site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ka ha nye ya nọmba fon ha, n’ihi ya kwa, ọ malitere ọmụmụ Bible abụọ.

11 Kwadoo Ndị Okenye n’Inyere Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi Aka: Ndị okenye nwere nnọọ mmasị n’iji ịhụnanya na-elebara ndị a anya. Ọtụtụ ndị dị otú ahụ amaliteghachila n’onwe ha ịga nzukọ ọgbakọ. Ha na-aghọta mkpa ọ dị isoro nzukọ Jehova na-akpakọrịta n’ụzọ chiri anya iji nwee nchebe ime mmụọ ahụ a kọwara n’Abụ Ọma nke 91. Ụfọdụ n’ime ndị a dị njikere ugbu a ikere òkè ọzọ n’ozi ubi. Ọ bụrụ na ndị ọzọ na-adịghị ejekwa ozi abịa Ememe Ncheta n’ọnwa a, ha pụrụ ikweta ka e duziere ha ọmụmụ Bible onwe onye. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ndị okenye ga-eme ndokwa ka mmadụ duziere ndị ahụ chọrọ enyemaka ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na a kpọọ gị òkù inye aka n’ụzọ dị otú a, a ga-eji nkwado gị kpọrọ ihe nke ukwuu.—Rom 15:1, 2.

12 ‘Nọgide Na-arụ Ezi Ọrụ’: Ọtụtụ ndị kewooro òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karịa, achọpụtawo n’ọnwa ndị sochirinụ na ihe ha rụzuru n’ozi ubi mụbara. Ha zutere ndị nwere mmasị bụ́ ndị ha hụrụ na ọ dị mkpa ịkpọtụghachiri. Nke a kwaliri ha itinyekwu mgbalị ịga ozi ubi ọtụtụ ugboro iji kpọtụrụ ndị ahụ nwere mmasị ọzọ. Ụfọdụ ndị malitere ọmụmụ ihe, nke ahụ nyeere ha aka ọbụna ikere òkè ka ukwuu n’ozi.

13 Ndị ọzọkwa nwetara ọṅụ dị nnọọ ukwuu n’ịrụkwu ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ nke na a kpaliri ha ịtụle ihe ndị ha na-ebute ụzọ. N’ihi ya, ụfọdụ belatara oge ha na-etinye n’ọrụ ego ma bụrụ ndị na-asụ ụzọ inyeaka n’akwụsịghị akwụsị. Ndị ọzọ enwewo ike ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ha tụkwasịrị olileanya ha n’ụzọ zuru ezu karị n’ebe Chineke nọ, ọ bụghịkwa n’ihe dị iche iche ụwa nwere inye. Ha chọpụtara na ịbụ ndị “na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe,” wetara ngọzi bara ụba site n’aka Jehova ma mee ka olileanya ha nwere ịdị “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” sikwuo ike. (1 Tim. 6:18, 19) N’ezie, ka ọnụ ọgụgụ ka ukwuu na-amalite ọrụ ọsụ ụzọ, ọgbakọ dum na-erite uru. Ndị ọsụ ụzọ nwere àgwà nke ịkọ ahụmahụ ha na ịkpọ ndị ọzọ ịbịa sonyere ha n’ozi, nke a na-eme ka e nwekwuo ọnọdụ ime mmụọ n’ọgbakọ.

14 Ka anyị nile “baa ọgaranya n’ezi ọrụ” n’oge Ememe Ncheta a nakwa mgbe ọ gasịrị site n’ịmụba òkè anyị na-ekere n’ozi Ndị Kraịst. Ka anyị gosi ekele anyị maka ihe Jehova meworo n’inye anyị olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume.—2 Pita 3:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya