“Na-eme Ihe Ọma n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”
1 “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu” na “Baa Ọgaranya n’Ezi Ọrụ” bụ isiokwu ndị e jiri mee ihe n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February na March 2002. (Kọl. 1:25; 1 Tim. 6:18) Ná mbipụta ndị ahụ, a gbara anyị ume itinyekwu mgbalị iji nyere ndị nwere mmasị aka ịga Ememe Ncheta, iji nyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ịmaliteghachi ozi n’ọgbakọ, na iji nyere ụmụ anyị na ndị ruru eru anyị na-eduziri ọmụmụ Bible aka ịmalite ikwusa ozi ọma. Obi abụọ adịghị ya na anyị enwetụwo ihe ịga nke ọma n’ihi ezi mgbalị anyị. Ugbu a, “ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị [nọgide] na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ.”—Gal. 6:10.
2 Kpọọ Ha Ịbịa Ọzọ: Na Nigeria, ihe karịrị mmadụ 250,000 na-abụghị ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ na-abịa Ememe Ncheta kwa afọ. Ebe ọ bụ na ọnụnọ ha na-egosi na ha nwetụrụ mmasị, gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji kpalie ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi” ịghọ “ndị kwere ekwe”? (Ọrụ 13:48) Gbaa ha ume ịbịaghachi nzukọ ọgbakọ ngwa ngwa o kwere mee.
3 Gịnị ma ị kpọọ onye nwere mmasị òkù ịbịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ iji nụ ụtọ ntụle na-adọrọ mmasị nke amụma Aịzaịa? Ọ bụrụ na ị bụ onye ikwu ma ọ bụ enyi nke onye ahụ, ọ bụrụkwa na e kenyere gị ikwu okwu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke na-esonụ, ị pụrụ ịkpọ onye ahụ òkù ịbịa gere okwu gị. Mee ka ọ mata isiokwu nke okwu ihu ọha ndị a ga-ekwu n’izu ndị na-abịa n’ihu. (E kwesịrị ịmapawa usoro kasị ọhụrụ nke okwu ihu ọha na bọọdụ ịma ọkwa.) Chọọ ohere ọ bụla iji kpalie n’ime onye ahụ ọchịchọ ife Jehova. Otú ọ dị, ọ bụrụkwa na ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ na-amụrụ ya Bible, ị pụrụ iji obiọma gwa ya ka ị mụọrọ ya ihe.
4 Nọgide Na-agba Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi Ume: Ọtụtụ ndị na-abịa Ememe Ncheta araraworị onwe ha nye Jehova. Otú ọ dị, ha nọkatara kwụsị ikwusa ozi ọma ahụ. Ma, Pọl gbakwara anyị ume “ime ihe ọma . . . karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Gal. 6:10) N’ihi ya, ndị na-adịghị ejekwa ozi kwesịrị ịbụ ndị bụ́ isi a ga-elekwasị anya.
5 Ikekwe ụfọdụ ndị anabataworị agbamume nke ndị okenye na ndị ọzọ ịmaliteghachi ikere òkè n’ozi. Ọ bụrụ na ndị okenye ekenye gị onye nkwusa e mere ka ọ maliteghachi ije ozi ka gị na ya jee ozi, mata na ịhụnanya nke gị onwe gị n’ebe Jehova nọ nakwa mmasị i nwere n’ozi ubi ga-enyekwu onye ahụ obi ike. Gosi ya otú ị na-esi ekere òkè n’akụkụ dị iche iche nke ozi ahụ ka o wee nwee ike inweta ọṅụ na ya, ịnọgidesi ike n’ọrụ nkwusa ahụ, nakwa inweta ngọzi Jehova.
6 Mee Ka Ndị Nkwusa Ọhụrụ Malite Ozi n’Ụzọ Dị Mma: Mgbe otu nwanyị nke malitere inwe mmasị ọhụrụ ghọtara na ya achọtawo ezi nzukọ Chineke, ọ chọrọ ịmalite ozi ozugbo. Mgbe ọ matasịrị ihe a chọrọ n’aka ya, o kwuru, sị: “Ka m malitenụ ozugbo.” Ọ bụrụ na a kwadowo onye ị na-amụrụ Bible ịmalite ikere òkè n’ozi ubi, nyere ya aka ịhụ mkpa ọ dị “ịmalite ya ozugbo,” n’ihi ya kwa, mee ka onye nkwusa ọhụrụ ahụ malite ozi n’ụzọ dị mma. Nyere ya aka inwe ụzọ ọ ga-esi na-akwadebe ma na-ekerechi òkè anya n’ozi ubi kwa izu.
7 Ọ bụrụ na ọ bụ nwa nke gị ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, soro ya rụọ ọrụ ka o wee nwee ọganihu dị ka afọ ndụ na ikike ya si dị. Site n’obere enyemaka gị, ọ pụrụ iju gị anya ịhụ na ọ pụrụ isoro mmadụ nwee nkwurịta okwu n’ụzọ na-aga nke ọma, gụọ Bible ma nyefee akwụkwọ. Mgbe ọ chọtara ezigbo onye nwere mmasị n’ozi ubi, zụọ ya ime nletaghachi na isochi mmasị ahụ.
8 Mụbaa Ozi nke Gị: Ọnọdụ gị ọ̀ ga-enye gị ohere ikere òkè ka ukwuu n’ọrụ izisa ozi ọma ọbụna gafee oge Ememe Ncheta? Ị̀ pụrụ ịgbakwụnye otu awa ma ọ bụ abụọ kwa izu n’awa ole ị na-etinyekarị n’ozi? Ị̀ na-elepụ anya n’ihu na kalenda maka mgbe ị ga-enwe ike ịsụ ụzọ inyeaka ọzọ? Ka ị̀ pụrụ ịhazi ụzọ ndụ gị iji banye n’ozi oge nile? Mgbalị nile anyị na-etinye n’ozi pụrụ inyere mmadụ aka ịnabata eziokwu ahụ! (Ọrụ 8:26-39) Ka anyị na-elepụ anya n’ụbọchị ndị dị n’ihu, ka anyị ‘na-achụso ihe dị mma mgbe nile n’ebe ibe anyị nọ nakwa n’ebe ndị ọzọ nile nọ.’—1 Tesa. 5:15.
Igbe dị na peeji nke 3]
Nọgide Na-enyere Ndị A Aka:
□✔ Ndị Bịara Ememe Ncheta
□✔ Ndị Nkwusa E Mere Ka Ha Maliteghachi Ije Ozi
□✔ Ndị Nkwusa Ọhụrụ A Na-emebeghị Baptizim