Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Sept. 15
“Ndị mmadụ n’ụwa nile anụla banyere Jizọs Kraịst. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ nanị mmadụ nkịtị nke mere ihe ndị dị ịrịba ama. Ndị ọzọ na-efe ya dị ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ònye ka i chere Jizọs Kraịst bụ? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-akọwa kpọmkwem onye ọ bụ, ebe o si bịa, na ebe ọ nọ ugbu a.” Gụọ Jọn 17:3.
Ụlọ Nche Oct. 1
Gụpụta ajụjụ dị n’ihu magazin ahụ. Ị gụpụta ya, gị ajụọ, sị: “Ị̀ maara ihe ịrịba ama a na-ekwu banyere ya ebe a? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Matiu 24:3.] Ụlọ Nche a tụlere ihe ịrịba ama ise bụ́ isi ma kọwaa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta ha.” Gosi ya igbe dị na peeji nke 6.
Teta! Oct. 8
“Ọtụtụ mmadụ apụghị inweta ezigbo ụlọ ha ga-ebi na ya. Ì chere na oge na-abịa mgbe onye ọ bụla ga-enwe ezigbo ụlọ? [Chere ka ọ zaa.] Teta! lebara anya n’otú ihe si kwụrụ ugbu a n’ihe banyere nsogbu ụkọ ụlọ. O gosikwara ihe mere anyị pụrụ iji nwee obi ike na nkwa a Chineke kwere ga-emezu.” Gụọ Aịsaịa 65:21, 22.
“Nsogbu ịṅụ mmanya n’ụzọ na-adịghị mma na-akpata abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Magazin a na-egosi ihe mmanya na-aba n’anya na-eme n’ahụ́ mmadụ. [Gosi ya ihe osise dị na peeji nke 7.] Isiokwu ndị a na-egosi otú ndị mmadụ pụrụ isi kwụsị ịṅụbiga mmanya ókè nakwa ihe ndị ọzọ pụrụ ime iji nyere ha aka.”