Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Dec. 15
“Ọtụtụ mmadụ na-enwe nchegbu banyere otú oge Krismas si ghọzie oge azụmahịa. Ì chere na a hapụla isi ihe e ji maka ya na-agba Krismas? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụle otú ụzọ e si eme ememe ụfọdụ siworo gbanwee ka oge na-aga. Ọ na-atụlekwa otú anyị pụrụ isi na-enye Chineke na Kraịst nsọpụrụ n’ezie.” Gụọ Jọn 17:3.
Ụlọ Nche Jan. 1
“Ụmụ mmadụ nwere ike nke ime ihe ọma, n’agbanyeghị nke ahụ, ha na-emekarị ihe ọjọọ ndị na-adịtụghị enye ọnụ okwu. Ọ̀ dịtụla mgbe i chere ihe kpatara ya? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-enye azịza sitere na Bible. Ọ kọwakwara otú ihe ọma ga-esi emeri ihe ọjọọ n’ikpeazụ.” Gụọ Ndị Rom 16:20.
Teta! Jan.–Mar.
“Ihe dị ka afọ 85 gara aga, otu ọrịa na-efe efe gburu ọtụtụ mmadụ n’ime izu 24 karịa ka ọrịa AIDS gburula n’ime afọ 24. Ụfọdụ sị na ọ bụ nke kasị njọ n’ime ọrịa na-efe efe e nwetụrụla n’ụwa. Ị̀ nụtụla banyere ahụ́ ọkụ ahụ si Spen? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụle ma ọrịa dị otú ahụ ọ pụrụ ịbịa ọzọ. O kwukwara ihe ndị mere a ga-eji nwee olileanya.” Gụọ Aịsaịa 33:24.
“Ị̀ na-adị na-eche otú ụwa ga-adị n’ihe dị ka afọ 20 ma ọ bụ 30 na-abịanụ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Abụ Ọma 119:105.] Bible na-eme ka ihe doo anyị anya ka anyị wee nwee ike ịmara ihe ọdịnihu ga-abụ. Magazin a na-atụle amụma ndị na-egosi oge anyị nọ na ya ugbu a nakwa ihe mere anyị ga-eji na-atụ anya ọdịnihu ka mma.”