Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Dec. 15
“N’oge ezumike, ọtụtụ ndị na-agbalị imere ndị ọzọ ihe ọma na igosi ha ọmịiko. Ì chere na ụwa ga-aka mma ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-egosi ibe ha ọmịiko n’oge nile n’afọ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gụọ 1 Pita 3:8.] Magazin a gosiri uru ọmịiko bara ma kwuo ụzọ ụfọdụ bara uru anyị nwere ike isi gosi ọmịiko.”
Ụlọ Nche Jan. 1
“Ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Dị ka ihe atụ, lee ekpere a a ma ama Jizọs kụziiri ụmụazụ ya. [Gụọ Matiu 6:9, 10.] Ì chetụla ihe Alaeze ahụ bụ na mgbe ọ ga-abịa? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a gosiri ihe Bible kwuru n’okwu a.”
Teta! Oct.–Dec.
“Ọ dị nnọọ mkpa ka ndị nne na nna na-ama ihe ụmụ ha na-eme, ndị enyi ha, na ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ha mee n’ụlọ. Ị̀ ma ihe mere o ji dị mkpa? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gụọ Ilu 14:15.] Ebe ọ bụ na ụmụaka ahụ enweghị ahụmahụ ka ndị toro eto, ndị na-achọ ndị ha ga-emetọ nwere ike inweta ha. Magazin a gosiri otú i nwere ike isi chebe ụmụ gị ka ihe ọ bụla ghara ime ha.”
“Ụfọdụ ndị nne na nna chere na ha ga-eme ka obi daa ụmụ ha mbà ma ọ bụ mee ka ụmụ ha gbawara ha ọsọ ma ọ bụrụ na ha egosi ha na ọ bụ ha ka ikike dị n’aka. Olee ihe i chere? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Bible gwara ndị nne na nna ka ha meere ụmụ ha. [Gụọ Ilu 29:17.] Isiokwu dị na peeji nke 23 na magazin a gosiri otú ndị nne na nna nwere ike isi gosi ụmụ ha na ọ bụ ha ka ikike dị n’aka n’achịghị ha n’aka ike.”