‘Nọgide Na-eso M’
1 Ọtụtụ mmadụ bụ nanị ihe ndị na-amasị ha ka ha na-eme, n’agbanyeghị nke ahụ, ha adịkebeghị enwe obi ụtọ. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Jizọs tụrụ aro ka anyị na-enye ihe n’achọghị ọdịmma onwe anyị nanị n’ihi na nke ahụ na-enye ezi obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya . . . nọgidekwa na-eso m.” (Mak 8:34) Nke a pụtara ihe karịrị mmadụ ịnapụ onwe ya ihe ụtọ ụfọdụ site n’oge ruo n’oge. Ọ pụtara na kwa ụbọchị, anyị ga na-eme ihe na-amasị Jehova, ọ bụghị ihe na-amasị anyị onwe anyị.—Rom 14:8; 15:3.
2 Were Pọl onyeozi dị ka ihe atụ. N’ihi “abamuru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs,” Pọl hapụrụ ịchụso ọchịchọ onwe ya ma tinye onwe ya n’ọrụ ime ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ gaa n’ihu. (Fil. 3:7, 8) O kwuru, sị: “N’akụkụ nke m, m ga-eji oké ọṅụ mefuo ihe ma bụrụ onye e jiri mee ihe n’ụzọ zuru ezu” n’ijere ndị ọzọ ozi. (2 Kọr. 12:15) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee otú m si eji oge m, ume m, ike m, na ihe onwunwe m eme ihe? Uche m nile ọ̀ dị n’ime ihe ga na-amasị mụ onwe m, ka m̀ na-achọ ime ihe na-amasị Jehova?’
3 Ohere Ndị Anyị Nwere Iji Nye Ihe: Kwa afọ, ndị Chineke na-etinye ihe karịrị otu ijeri awa n’ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na-azọpụta ndụ. N’ime ọgbakọ, ma okenye ma ụmụaka na-arụ ọrụ dịgasị iche iche na-abara ndị ọzọ uru. A na-arụkwa nnukwu ọrụ ma a bịa n’ihe banyere mgbakọ ukwu na mgbakọ nta nakwa n’ihe banyere iwu ụlọ ndị a na-anọ eme ka ezi ofufe na-aga n’ihu na ịhụ na a na-elekọta ha. Chegodị echiche banyere enyemaka ụmụnna so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ na ìgwè Na-aga Eleta Ndị Ọrịa ji ịhụnanya na-enye. Mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nile dị otú a bụụrụ otú ụmụnna Ndị Kraịst anyị ngọzi!—Ọma. 110:3.
4 Mgbe ihe ọdachi mere ma ọ bụ mgbe e nwere ọnọdụ mberede, anyị pụrụ inwe ohere nke iwepụta onwe anyị n’ụzọ dị iche iche iji nye aka. Ma ọtụtụ mgbe, anyị nwere ike ịchọpụta nnọọ na o kwesịrị ka anyị nyere Onye Kraịst ibe anyị aka ma ọ bụ gbaa ya ume. (Ilu 17:17) Anyị na-eṅomi ihe nlereanya Jizọs mgbe ọ bụla anyị ji obi anyị nile wepụta onwe anyị ijere ndị ọzọ ozi ma na-eme ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ gaa n’ihu. (Fil. 2:5-8) Ka anyị gbalịsie ike ịnọgide na-eme otú a.