Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Iji Amara Emeso Ha Ihe
1 ‘Onye dị amara ka Jehova bụ.’ (Ọma. 145:8) Ọ bụ ezie na ọ bụ Eze Eluigwe na Ala, ọ na-eji obiọma, nchebara echiche, na nkwanye ùgwù emeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe. (Jen. 13:14; 19:18-21, 29) Anyị pụrụ ime ka ụzọ anyị si ezi ozi ọma ka mma site n’iṅomi Chineke anyị na-eme amara. (Kọl. 4:6) Nke a gụnyere ihe karịrị nanị iji olu ọma na ụzọ dị ùgwù na-ekwu okwu.
2 Site n’Ọnụ Ụzọ Ruo n’Ọnụ Ụzọ: Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị abịa n’ụlọ mmadụ n’oge na-adabaghị adaba ma ọ bụ mgbe o ji nnọọ ọrụ n’aka nke na ọ pụghị iso anyị kwurịta okwu? Anyị kwesịrị igosi na anyị ghọtara ọnọdụ ọ nọ na ya site n’igbu okwu anyị nkenke, ma ọ bụ site n’ịgwa ya na anyị ga-abịaghachi n’oge ọzọ. Anyị kwesịrị izere isi ọnwụ na ndị mmadụ ga-ewerịrị akwụkwọ anyị ma ha sị na ha achọghị iwe. Ọ bụrụ na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche, nke a ga-akpali anyị ịkwanyere ihe onwunwe ha ùgwù, dị ka ihe atụ, site n’imechiri ha ụzọ ha, iyipụ akpụkpọ ụkwụ anyị tupu anyị abanye n’ụlọ ha, na ịkụziri ụmụ anyị ime otú ahụ. Anyị kwesịrị ịhụ na anyị edebeghị akwụkwọ ọ bụla anyị debeere ndị na-anọghị n’ụlọ n’ebe ndị na-agafe agafe ga-ahụ ya anya. N’ezie, ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eme amara, nke a ga-akpali anyị ịdị na-emeso ndị ọzọ ihe dị nnọọ ka anyị chọrọ ka ha siri na-emeso anyị.—Luk 6:31.
3 Mgbe Anyị Na-agba Àmà n’Okporo Ámá: Mgbe anyị na-agba àmà n’okporo ámá, anyị pụrụ igosi nkwanye ùgwù site n’ịghara ịnọchiri ndị na-agafe agafe ụzọ nakwa site n’ịghara izukọta n’ihu ụlọ ahịa ndị mmadụ. Anyị kwesịrị ịghọta ọnọdụ ndị mmadụ site n’izi nanị ndị nwere minit ole na ole ozi ọma kama ịchọwa izi ndị o doro anya na ọ dị ha ngwa ngwa ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, n’ihi ụzụ a na-eme n’okporo ámá, ọ ga-adị mkpa ka anyị kwusie okwu ike ka onye anyị na-agwa okwu wee nụ ihe anyị na-ekwu. Ma anyị kwesịrị iji nkwanye ùgwù mee nke a, ọ bụghị ime ya otú ga-eme ka e lewe anyị.—Mat. 12:19.
4 Mgbe E Ji Telifon Agba Àmà: Ọ bụrụ na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche, nke a ga-akpali anyị ịnọ n’ebe ụzụ na-adịghị mgbe anyị ji telifon agba àmà. Anyị na-egosi na a zụrụ anyị nke ọma site n’ịkọwa onwe anyị n’egbughị oge na ikwu ihe mere anyị ji kpọọ. Ikwunye okwu na telifon na iji olu dị nro na-ekwu okwu ga-enye aka mee ka ndị mmadụ soro anyị nwee mkparịta ụka na-ewuli elu, bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. (1 Kọr. 14:8, 9) Ọ bụrụ na anyị egosi obiọma, na-echebara ndị ọzọ echiche, ma na-akwanyere ha ùgwù n’ụzọ ndị a anyị tụlere, anyị na-eṅomi Jehova, bụ́ Chineke anyị na-eme amara.