Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/07 p. 4
  • “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?”
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nye Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
    Teta!—2006
  • (1) Jụọ Ajụjụ, (2) Gụọ Akụkụ Akwụkwọ Nsọ, (3) Gosi Isiakwụkwọ Kọwara Ya
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ihe Ọhụrụ Na-enyere Anyị Aka Izi Ndị Mmadụ Ozi Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 3/07 p. 4

“Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?”

1. Olee ihe ndị na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike?

1 Ị̀ hụrụ Okwu Chineke n’anya ma ya abụrụ na ọ na-esiri gị ike icheta akụkọ ndị a kọrọ na Bible ma ọ bụ icheta kpọmkwem ebe e dere ha n’Akwụkwọ Nsọ? Ị̀ ga-achọ ka ụmụ gị ghọta eziokwu ndị a kụziri na Bible nke ọma? Isiokwu bụ́ “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?” nke na-apụta na Teta! site n’oge ruo n’oge pụrụ inyere ma okenye ma ụmụaka aka ịghọta Okwu Chineke nke ọma.—Ọrụ 17:11.

2. Olee ụzọ ndị a pụrụ isi jiri akụkụ dị iche iche nke isiokwu bụ́ “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?” mee ihe?

2 Olee ụzọ kasị mma ị pụrụ isi jiri isiokwu a na-apụta na Teta! mee ihe? Teta! nke January–March 2006 tụrụ aro, sị: “Lebatụgodị anya na peeji nke 31 . . . Ụfọdụ n’ime ihe ndị dị na peeji ahụ ga-amasị ndị na-eto eto; ndị ọzọ ga-esitụrụ ndị nwere ihe ọmụma Bible ike. Akụkụ bụ́ ‘Olee Afọ O Mere?’ ga-enyere gị aka inwe ihe ndepụta na-egosi oge mmadụ ndị a kọrọ banyere ha na Bible dịrị ndụ na oge ihe ndị dị mkpa a kọrọ banyere ha mere. Ọ bụ ezie na a pụrụ ịhụ azịza nke akụkụ bụ́ ‘N’ime Mbipụta Nke A’ n’ebe nile na Teta! ahụ, azịza nke ihe ka ọtụtụ n’ajụjụ ndị nke ọzọ ga-apụta n’otu n’ime peeji nke Teta! ahụ ajụjụ ndị ahụ dị na ya, ma a ga-akpọgide ha isi n’ala. Ọ ga-adị mma ka i mee nnyocha tupu gị agụọ ebe ahụ e depụtara azịza ha. E mesịa, ị kọọrọ ndị ọzọ ihe ị mụtara. Gị na ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị pụdịrị iji ihe ọhụrụ a e tinyere na Teta! nke bụ́, ‘Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?,’ na-enwe mkparịta ụka dabeere na Bible.”

3. Olee otú ezinụlọ ụfọdụ sirila rite uru n’isiokwu a na-apụta na Teta!, oleekwa akụkụ ya ndị kasị amasị gị?

3 N’ezie, ọ na-amasị ọtụtụ ezinụlọ iji isiokwu a enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. Otu nne dere, sị: “Mụ na di m chere na ọ ga-adị mma ka anyị webata akụkụ bụ́, ‘Foto Ụmụaka Ga-achọ Ebe Ha Dị,’ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị ka o wee na-ekpo ọkụ ma na-atọkwa nwa anyị nwanyị dị afọ atọ ụtọ. Ihu anyị na-abụ sọ ọchị mgbe anyị na-ahụ ya ka o ji obi ụtọ jide Teta! nke ya ma na-asagharị ya ruo mgbe ọ hụrụ ihe ọ na-achọ.” Otu nna nọ na Brazil kwuru, sị: “Isiokwu a na-apụta na Teta! na-amasị mụ na nwa m nwoke dị afọ asaa nke ukwuu. O nyerela Moises aka ịdị na-ege ntị, ịdị na-asapeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ịdị na-aghọta ihe osise, na ịmata mgbe ihe ji mee.” Otu nwatakịrị nwanyị dị afọ asatọ aha ya bụ Ashley dere, sị: “Ana m ekele unu maka isiokwu a bụ́ ‘Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?’ nke na-adị n’ebe ngwụcha Teta! Ana m amụta ọtụtụ ihe banyere Bible site na ya.”

4. Olee otú ezinụlọ pụrụ isi jiri isiokwu a bụ́ “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?” na-enwe ọmụmụ Bible ezinụlọ?

4 Ọ́ gaghị adị mma ma unu webata akụkụ ahụ bụ́ “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?” mgbe ụfọdụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ unu? Unu nwere ike iji akwụkwọ Index ma ọ bụ Watchtower Library nke dị na CD-ROM chọta azịza nke ajụjụ ndị kasị sie ike. Site n’ime otú a, unu na-akụziri ụmụ unu otú e si eme nnyocha. Ọ bụrụ na unu nwere ụmụaka ndị totụrụla eto, ọ́ gaghị adị mma ma unu gwa ha ka ha mee nnyocha ndị sitụrụ ike iji chọta azịza nke ajụjụ bụ́ “Ònye Ka M Bụ?” ma ọ bụ “Olee Afọ O Mere?” tupu unu amalite ọmụmụ ihe ezinụlọ unu? Ha nweziri ike ịkọ ihe ha metara ná nnyocha ha, n’oge ọmụmụ ihe unu. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ ejiri peeji a mee ihe nke ọma, ọ ga-abụ otu ụzọ ha ga-esi kụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ ha, si otú a nyere ha aka isite na mgbe ha ka bụ ụmụ ọhụrụ mata “ihe odide ndị ahụ dị nsọ.”—2 Tim. 3:15; Deut. 6:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya