Nọgide “Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”
1 N’ihe atụ Jizọs ji mee ihe, o ji onwe ya tụnyere ezi osisi vaịn, jiri Nna ya tụnyere Onye kụrụ osisi vaịn ahụ, jirikwa ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ tụnyere alaka ya ndị na-amịpụta mkpụrụ. Mgbe Jizọs na-akọwa ihe bụ́ ọrụ Onye kụrụ osisi vaịn ihe atụ ahụ, o mesiri ya ike na ọ dị mkpa ka alaka ndị ahụ rapagidesie ike n’ahụ́ osisi vaịn ahụ. (Jọn 15:1-4) Ihe mmụta dị na ya bụ na onye ọ bụla nke ya na Jehova na-akpachi anya ga na-amị mkpụrụ dị ka alaka nke “ezi osisi vaịn” ahụ bụ́ Jizọs Kraịst. Anyị ga-anọgiderịrị na-amịpụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” na mkpụrụ Alaeze ahụ n’ụba.—Gal. 5:22, 23; Mat. 24:14; 28:19, 20.
2 Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ: Otú e nwere ike isi mata ma ànyị na-eme nke ọma n’ofufe Jehova bụ otú anyị na-amịpụtaru mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ị̀ na-agbalịsi ike ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke site n’ịdị na-amụchi Okwu Chineke anya na ịdị na-atụgharị uche na ya mgbe nile? (Fil. 1:9-11) Alala azụ n’ịrịọ Jehova maka mmụọ nsọ ya, bụ́ nke nwere ike ime ka i nwee àgwà ndị ga na-ewetara Jehova otuto ma mee ka ị na-enwe ọganihu n’ofufe Jehova.—Luk 11:13; Jọn 13:35.
3 Ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ga-enyekwara anyị aka ịghọ ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi. Dị ka ihe atụ, ịhụnanya na okwukwe na-akpali anyị iwepụta oge site n’ihe omume nke onwe anyị iji nwee ike ịdị na-agachi ozi ubi anya. Àgwà ndị dị ka udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye na-enyere anyị aka imeso ndị na-emegide anyị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọṅụ na-enyere anyị aka inweta afọ ojuju n’ozi anyị ọbụna mgbe ndị mmadụ na-adịghị ege anyị ntị.
4 Mkpụrụ Alaeze: Ọ dịkwa mkpa ka anyị na-amị mkpụrụ Alaeze. Nke a na-agụnye “mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha [Jehova] n’ihu ọha.” (Hib. 13:15) Anyị na-eme nke a site n’iji ịnụ ọkụ n’obi nọgidesie ike na-ekwusa ozi ọma. Ị̀ na-agbalịsi ike ịdị na-amịpụtakwu mkpụrụ Alaeze ahụ site n’ime ka otú i si ezi ozi ọma kakwuo mma?
5 Jizọs kwuru na mkpụrụ nke ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi ga na-amị agaghị aha nhata. (Mat. 13:23) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịdị na-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ, kama anyị kwesịrị ịdị na-enye Jehova ihe nile anyị nwere ike inye ya. (Gal. 6:4) Ọ bụrụ na anyị ejiri ezi obi jiri Okwu Chineke nyochaa ọnọdụ anyị, nke a ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enye Jehova otuto site n’ịdị “na-amị mkpụrụ dị ukwuu.”—Jọn 15:8.