Ifekọ Jehova Ọnụ Dị Ka Ezinụlọ
1 Ezinụlọ ndị ohu Jehova n’oge ochie na-emekọ ọtụtụ ihe ọnụ. Ha na-arụ ọrụ dịịrị ha n’ụbọchị dị ka otu ezinụlọ. Karịsịa, ha na-efekọ Jehova ọnụ. (Lev. 10:12-14; Deut. 31:12) N’ọtụtụ ebe, ndị ezinụlọ enwekebeghị ihe ha na-emekọ ọnụ n’oge a. Ma, Ndị Kraịst ghọtara na ọ bara uru ka ezinụlọ na-emekọ ihe ọnụ, karịsịa, ma a bịa n’ihe metụtara ofufe. O doro anya na ọ na-atọ Onye malitere ezinụlọ ụtọ ịhụ ka ezinụlọ dị iche iche na-efekọ ya ofufe ọnụ.
2 Na-agakọnụ Ozi Ọma Ọnụ: Ịgakọ ozi ọma ọnụ na-ejikọ ezinụlọ ọnụ. Ya mere, okenye nke ya na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-arụkọ n’ozi ọma ga-ewepụtakwa oge ka ya na nwunye ya na ụmụ ya na-arụkọ mgbe nile n’ozi ọma. (1 Tim. 3:4, 5) Ọ bụ ezie na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nwere ọtụtụ ihe ha na-eme, ha na-ewepụta oge ka ha na nwunye ha na-arụkọ n’ozi ọma.
3 Ndị nne na nna ha na ụmụ ha na-agakọ ozi ọma na-enyere ụmụ ha aka inwe ọganihu n’ikwusa ozi ọma. Ọ bụghị nanị na nke a ga-eme ka ụmụaka hụ ọṅụ na afọ ojuju ndị mụrụ ha na-enwe n’ozi a, kama, ha ga-ahụkwa ka ndị mụrụ ha na-egosi na ha hụrụ Jehova n’anya, hụkwa mmadụ ibe ha n’anya. (Deut. 6:5-7) Mkpa ọ dị ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-agakọ ozi ọma adịghị ebelata mgbe ụmụ ha tolitere. Otu di na nwunye, bụ́ ndị ụmụ ha ndị nwoke atọ nọ n’agbata afọ iri na ise na iri abụọ na otu, ka na-ewepụta oge ka ha na ha na-arụkọ n’ozi ọma mgbe nile. Nna ha sịrị: “Anyị na-akụziri ha ihe mgbe nile. Anyị na-ahụkwa na ọ tọrọ ha ụtọ, gbaakwa ha ume.”
4 Na-akwadebekọnụ Ọnụ: Ezinụlọ dị iche iche achọpụtala na ọ bara uru ịkwadokọ ozi ọma ọnụ. Ọ na-atọkarịkwa ụmụaka ụtọ ka ha na ndị ezinụlọ ha mụgharịa ihe ha ga-ekwu. Otú ha si eme ya bụ otu onye bụrụ onye nkwusa, onye nke ọzọ abụrụ onye nwe ụlọ. Otu onye mechaa, ibe ya emee. Ụfọdụ na-eji nkeji ole na ole eme nke a mgbe ha nwechara ọmụmụ ihe ezinụlọ.
5 Anyị na-enwekwu ọṅụ mgbe anyị na ndị anyị hụrụ n’anya rụkọrọ ọrụ dị mkpa, nke na-ejukwa afọ. N’ezie, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ma ndị ezinụlọ na-arụkọ ọnụ n’ozi ubi, site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ná nletaghachi nakwa n’iduzi ọmụmụ Bible! Ọ bụrụ na gị na ezinụlọ gị esi otú a na-efekọ Jehova ọnụ, i nwere ike iji ọṅụ kwuo, sị: “Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.”—Josh. 24:15.