Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/07 p. 1
  • Mee Ka Ndị Ogbenye Nwee Olileanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka Ndị Ogbenye Nwee Olileanya
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’isi Nso, Ọ Dịghị Onye Ga-abụ Ogbenye!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Njedebe nke Ịda Ogbenye Dị Nso
    Teta!—1998
  • Ruo Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Ndị Ogbenye Na-aghaghị Ichere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 10/07 p. 1

Mee Ka Ndị Ogbenye Nwee Olileanya

1 Jizọs nwere mmasị pụrụ iche n’ebe ndị ogbenye nọ. E nwere oge ndị ọ rụrụ ọrụ ebube wee nye ha nri, gwọọkwa ndị ọrịa. Ma, o lekwasịrị anya n’ịkpọsara ndị ogbenye “ozi ọma.” (Mat. 11:5) Ozi ọma Ndị Kraịst na-ezisa taa ka na-abara ndị ogbenye na ndị ọzọ uru.—Mat. 24:14; 28:19, 20.

2 Ezi Olileanya: Ndị ụkọchukwu Krisendọm na-ekwekarị ndị ogbenye nkwa na ọ bụrụ na ha enye ego buru ibu na chọọchị, ha ga-aba ọgaranya. Otú ọ dị, Bible na-akụzi na ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-akwụsị ịda ogbenye, gwọtakwa nsogbu nile mmadụ nwere. (Ọma 9:18; 145:16; Aịsa. 65:21-23) Site n’igosi ndị ogbenye ihe Bible na-akụzi n’ezie, anyị na-eme ka ha nwee olileanya, na-enyekwara ha aka igbo mkpa ime mmụọ ha.—Mat. 5:3.

3 Ndị Farisii nke oge Jizọs ledara ndị ogbenye anya, na-akpọ ha ‘am-ha·’aʹrets, ma ọ bụ “ndị ala” n’ụzọ ịkwa emo. Ma, Jizọs lere “ọbara ha,” ma ọ bụ ndụ ha, anya dị ka ihe dị “oké ọnụ ahịa.” (Ọma 72:13, 14) Anyị pụrụ iṅomi Jizọs ma na-emere ndị ogbenye dị otú ahụ “amara” site n’inwe obiọma na obi ebere. (Ilu 14:31) Anyị ekwesịtụghị ikwu okwu mkparị banyere ndị bi n’ógbè ndị dara ogbenye ma ọ bụ gosi na anyị enwechaghị mmasị ịgbara ha àmà. Ọtụtụ ndị na-aṅa ntị n’ozi Alaeze bụ ndị ogbenye.

4 Nyere Ha Aka Ugbu A: Ịkụziri ndị ogbenye nọ n’ókèala anyị ụkpụrụ Bible na-enyekwara ha aka ugbu a ka ịda ogbenye ghara ịkpacha ha aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, Bible katọrọ ịṅụbiga mmanya ókè, ịgba chaa chaa, ịdị umengwụ, ise siga ma ọ bụ ịkpọ ụtaba, na omume ndị ọzọ so akpata ịda ogbenye. (Ilu 6:10, 11; 23:21; 2 Kọr. 7:1; Efe. 5:5) Akwụkwọ Nsọ gbara ume ka anyị na-akwụwa aka ọtọ, jirikwa ‘mkpụrụ obi anyị dum,’ na-arụ ọrụ. A chọrọ ka ndị e were n’ọrụ na-akpa àgwà ndị a. (Kọl. 3:22, 23; Hib. 13:18) N’ezie, n’otu nnyocha e mere, ọtụtụ ndị na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ kwuru na ịkwụwa aka ọtọ na ikwesị ntụkwasị obi bụ àgwà abụọ kacha amasị ha ka ndị ha na-ewe n’ọrụ nwee.

5 Ahụhụ ndị ogbenye na-ata na-emetụ Jehova n’obi. N’oge na-adịghị anya, Jizọs Kraịst ga-anapụta “ogbenye mgbe ọ na-etiku ya.” (Ọma 72:12) Tupu oge ahụ eruo, anyị nwere ihe ùgwù nke iji ozi ọma dị na Bible, nke na-eme ka e nwee olileanya, na-akasi ndị ọzọ obi, tinyere ndị ogbenye.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya