Anyị Na-agwa Ndị Ọzọ Banyere Olileanya Anyị Nwere n’Alaeze Chineke
1 N’ụbọchị ikpeazụ ndị a dị oké egwu, ọtụtụ ndị nọ n’ụwa enweghị olileanya. (Efe. 2:12) Ndị ọzọ akpaala àgwà iberibe site n’ịtụkwasị akụnụba, ndị ọchịchị bụ́ mmadụ, sayensị ọgbara ọhụrụ, na ihe ndị ọzọ, obi. Obi dị anyị nnọọ ụtọ na anyị nwere ezi olileanya maka ọdịnihu, olileanya nke bụ́ “arịlịka maka mkpụrụ obi, bụ́ ma nke e ji n’aka ma nke guzosiri ike”!—Hib. 6:19.
2 N’oge ọchịchị Alaeze Chineke, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. A ga-akpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Ọrụ 24:15) Ịda ogbenye, ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, ime agadi, na ọnwụ agaghịkwa adị. (Ọma 9:18; Mat. 12:20, 21; Mkpu. 21:3, 4) Ihe ndị a so ná nkwa ndị Jehova kwere bụ́ ndị ga-emezu n’oge na-adịghị anya. N’ime ihe ndị anyị na-atụ anya ha, olee nke kasị agụ gị agụụ ka o mezuo?
3 Kwusaa Ozi Ọma: Anyị kwesịrị ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya anyị nwere n’Alaeze ahụ. Ịhụnanya anyị nwere maka Chineke na ndị agbata obi anyị na-akpali anyị iṅomi Jizọs na “ịkpọsara ndị ogbenye ozi ọma, . . . ikwusa ntọhapụ nye ndị a dọọrọ n’agha na ịmaliteghachi ịhụ ụzọ nye ndị ìsì, izilaga ndị e gwepịara egwepịa dị ka ndị a tọhapụrụ atọhapụ.” (Luk 4:18) Pọl onyeozi kwusara ozi ọma n’ọma ahịa na n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ndị mmadụ. O jesiri ozi ahụ ike. (Ọrụ 18:5) Ịgbaso ihe nlereanya ya site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ga-eme ka “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba” ghara ime ka olileanya anyị nwere dị ka Ndị Kraịst nyụọ ọkụ.—Mak 4:19.
4 Anyị anaghị ekwe ka ndị na-enweghị mmasị n’ozi Alaeze ahụ, bụ́ ndị na-adịghị ihe ha ji ya kpọrọ ma ọ bụ ndị na-emegide anyị mee ka olileanya anyị nwere n’Alaeze ahụ nyụọ ọkụ. Anyị ‘na-ejidesi nkwupụta ihu ọha nke olileanya anyị ike n’amaghị jijiji.’ (Hib. 10:23) “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme” anyị. (Rom 1:16) Mgbe ndị mmadụ hụrụ na anyị kwenyesiri ike n’ihe anyị na-akụzi nakwa na anyị nọgidesiri ike na ya, ọ ga-akpali ụfọdụ imesị gee anyị ntị.
5 Ọ bụ ezie na ọ dị mma ịgwa ndị mmadụ na otú ọnọdụ ụwa si na-aka njọ na-emezu amụma Bible, anyị abụghị ndị na-ekwusa ọdachi. Kama nke ahụ, ebe ozi anyị hiwere isi bụ n’olileanya anyị nwere n’Alaeze ahụ—ozi ọma Alaeze Chineke. Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma a ma kwenyesie ike na ya “iji wee nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.”—Hib. 6:11.