Anyị Aghaghị Ịnọgide Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ozi Anyị
1 Kemgbe afọ 1992, Ndịàmà Jehova na-eji ihe karịrị otu ijeri awa arụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ndị na-eso ụzọ kwa afọ n’ụwa nile. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịtụnye obere ụtụ ná nnukwu ọrụ ahụ!—Mat. 28:19, 20.
2 N’ezie, ekele na otuto nile kwesịrị ịgara Jehova, bụ́ onye kwadorola anyị n’ozi anyị ‘n’oge ndị a pụrụ iche.’ (2 Tim. 3:1) Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji nọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ a dị mkpa?
3 Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-anụ Ọkụ n’Obi: Ịhụnanya si n’ala ala obi anyị nwere maka Chineke na ndị agbata obi anyị, tinyere ọchịchọ siri ike anyị nwere ibi ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke, na-akpali anyị ịnọgide na-aga n’ihu n’ozi Alaeze ahụ anyị na-eje. (Mat. 22:37-39; 1 Jọn 5:3) Ịhụnanya na-akpali anyị ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà ka anyị wee nwee ike ịrụ ọrụ nkwusa ahụ n’ụzọ zuru ezu.—Luk 9:23.
4 Gbalịa Ịnọgide Na-anụ Ọkụ n’Obi: Onye iro anyị bụ́ Ekwensu na-eme ihe nile o nwere ike ime iji mee ka ịnụ ọkụ n’obi anyị n’ozi anyị nyụọ ka ọkụ. Enweghị mmasị nke ndị bi n’ókèala anyị, ihe ndọpụ uche ndị dị n’ụwa a, otú o si esi ike inweta ihe ndị e ji ebi ndụ, na nchegbu banyere ọrịa anyị na-arịakarịzi bụ nanị ole na ole n’ihe ndị ọ na-eji anwa ime ka anyị kwụsị ịnụ ọkụ n’obi.
5 N’ihi ya, anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji nọgide na-anụ ọkụ n’obi. Ọ dị anyị mkpa ime ka “ịhụnanya ahụ [anyị] nwere na mbụ” na-esiwanye ike. Nke ahụ gụnyere anyị ịdị na-agụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, mgbe nile, nakwa ịdị na-eji ihe ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye anyị iji wusie mmekọrịta anyị na Chineke ike na-eme ihe.—Mkpu. 2:4; Mat. 24:45; Ọma 119:97.
6 Amụma Bible na-egosi nnọọ na ụbọchị Jehova ga-ebibi ndị na-adịghị asọpụrụ ya ji ọsọ na-abịa. (2 Pita 2:3; 3:10) Ka anyị buru nnọọ nke ahụ n’obi ma rụsie ọrụ ike ịnọgide na-anụ ọkụ n’obi n’ozi anyị, na-eme ihe nile anyị nwere ike ime n’ọrụ ikwusa Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ taa!