‘Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Ị Na-anụ Ọkụ n’Obi’
1. Olee àgwà anyị kwesịrị iji na-ekwusa ozi ọma?
1 O nweghị ọrụ ọ bụla e nyere Ndị Kraịst nke anyị kwesịrị ileghara anya. Kama nke ahụ, a gbara anyị ume sị: “Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi. Bụrụnụ ndị ohu Jehova.” (Rom 12:11) Ma, e nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike ime ka anyị kwụsị ịnụ ọkụ n’obi n’ozi anyị. Olee ihe anyị ga-eme ka ịnụ ọkụ n’obi na mmasị anyị nwere n’ozi ọma anyị “nwuo dị ka ọkụ”?—2 Tim. 1:6, 7.
2. Olee ihe jikọrọ inwe ọmụmụ Baịbụl onwe onye na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?
2 Ọmụmụ Baịbụl Onwe Onye: Onye nkwusa Alaeze nke na-eme nke ọma bụ onye hụrụ iwu Chineke n’anya ma na-ekwe ka eziokwu dị na ya ruo ya n’obi. (Ọma 119:97) Anyị mụta ihe ọhụrụ na Baịbụl mgbe anyị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, ọ na-akpali obi anyị ma mee ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi. Ọ bụ ịhụnanya anyị nwere maka Onye na-akụziri anyị eziokwu ndị ahụ na otú o si agụ anyị agụụ izi ndị ọzọ ozi ọma na-akpali anyị inye Chineke otuto na ikwupụta aha ya n’ihu ọha. (Hib. 13:15) O doro anya na iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma na-egosi na anyị ji ya kpọrọ nnọọ ihe.
3. Olee otú mmụọ Chineke nwere ike isi nyere anyị aka n’ozi anyị?
3 Rịọ Chineke Mmụọ Ya: Anyị agaghị arụpụtali ezigbo ihe n’ozi anyị n’ike aka anyị. Ọ bụ onye nwere mmụọ nsọ Chineke na-enwe ezigbo ịnụ ọkụ n’obi. (1 Pita 4:11) Ịbịarukwu onye bụ́ Isi Iyi nke ‘ike dị ukwuu’ nso ga-eme ka anyị nwee ike anyị ga-eji kwusaa ozi ọma n’atụghị egwu. (Aịza. 40:26, 29-31) Mgbe a na-akpagbu Pọl onyeozi n’ihi ozi ọma ya, o “nwetara enyemaka si n’ebe Chineke nọ.” (Ọrụ 26:21, 22) Mmụọ nsọ Jehova, nke na-enye ike, nwere ike inyere anyị aka ime nke ọma n’ozi anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ ya Chineke n’ekpere.—Luk 11:9-13.
4. Olee ihe ọma ịnụ ọkụ n’obi nwere ike iweta, oleekwa ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime?
4 Ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere maka ozi Alaeze ahụ na-emekarị ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nụwakwa ọkụ n’obi. (2 Kọr. 9:2) Mgbe anyị nọ ozi ọma, ndị mmadụ na-aka ege anyị ntị mgbe anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ha ozi ọma ma na-ekwu ya otú na-egosi na ihe anyị na-ekwu doro anyị anya. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ịnụ ọkụ n’obi anyị mee ka anyị ghara ịdị akọ nakwa igosi na anyị dị nwayọọ n’obi. (Taị. 3:2) Anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù mgbe ọ bụla anyị na-ezi ha ozi ọma, gosikwa na anyị ghọtara na ha nweere onwe ha ikpebi ihe ha ga-eme.
5. Olee ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-erube isi na ya?
5 Ebe anyị bụ ndị nkwusa Alaeze, ka anyị kwe “ka mmụọ Chineke mee ka [anyị] na-anụ ọkụ n’obi.” Ka anyị mụta ịnụ ọkụ n’obi site n’inwe ọmụmụ Baịbụl onwe onye nakwa ikpegara Jehova ekpere, bụ́ onye na-enye anyị mmụọ nsọ ya nke dị ike. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị ga-enwe ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi anyị ‘site n’ike mmụọ nsọ, na nkwenye siri ike.’—1 Tesa. 1:5.