Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/07 p. 8
  • Kasie Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kasie Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa Obi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kasie Ndị Na-eru Újú Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Otú Chineke Si Akasi Mmadụ Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • “Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Nkasi Obi Na Agbamume—Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Nke Nwere Ọtụtụ Akụkụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 12/07 p. 8

Kasie Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa Obi

1 Ọ dịtụbeghị mgbe nkasi obi dị ụmụ mmadụ mkpa otú ọ dị ha taa. Anyị na-agbaso ihe nlereanya Eze anyị, bụ́ Kraịst Jizọs, ma na-arụ ọrụ “ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa.”—Aịsa. 61:1.

2 Ụzọ Isi Mee Ya: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkasi ndị mmadụ obi, e kwesịrị iji okwu ndị na-egosi na anyị na-eche banyere ndị ọzọ na okwu ndị na-agba ume mara ozi anyị. Mgbe anyị kwụsịlatara ikwu banyere ihe ọjọọ na ozizi ụgha ndị dị n’ụwa, mkparịta ụka anyị na-ehiwezi isi n’eziokwu Akwụkwọ Nsọ na olileanya magburu onwe ya banyere nkwa ndị na-akasi obi Chineke kwere anyị. Nke a apụtaghị na anyị ekwesịghị ikwu okwu banyere Amagedọn. Ọrụ e nyere anyị bụ ịkpọsa “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere,” nakwa “ịdọ onye na-emebi iwu aka ná ntị ka o si n’ụzọ mmebi iwu ya pụta.” N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke ebughị n’obi ka anyị jiri ịdọ aka ná ntị banyere Amagedọn na nkọwa nke otú ọ ga-esi bibie ihe kpuchie isi ihe anyị na-ekwusa nke bụ́ ozi ọma nke alaeze Chineke.—Aịsa. 61:2; Ezik. 3:18; Mat. 24:14.

3 Site n’Ọnụ Ụzọ Ruo n’Ọnụ Ụzọ: Anyị na-ahụkarị ndị dara mbà n’obi n’ihi ọrịa, ọnwụ nke onye ha hụrụ n’anya, ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụ nsogbu ego. Ebe anyị bụ ndị na-eṅomi Kraịst, anyị ‘na-enwe ọmịiko’ n’ahụ́ ndị anyị zutere n’ozi ma na-emere ha ebere. (Luk 7:13; Rom 12:15) Ọ bụ ezie na anyị na-agụrụ onye ahụ otu amaokwu Bible ma ọ bụ abụọ ndị metụtara nsogbu ya, anyị aghaghị igosi na anyị ‘dị ngwa n’ịnụ ihe,’ bụ́ nke ga-eme ka ọ dịrị onye ahụ mfe ikwu otú obi dị ya. (Jems 1:19) Mgbe anyị buru ụzọ gee onye ahụ ntị, anyị ga-aka enwe ike ịkasi ya obi.

4 N’oge kwesịrị ekwesị ná mkparịta ụka ahụ, anyị nwere ike ịsị, “M ga-achọ ịgụrụ gị okwu ụfọdụ na-agba ume site na Bible.” Anyị kwesịrị iji akọ mee ihe, ghara ịgbaghawa ihe ọ bụla na-ezighị ezi onye ahụ kwuru. Kama nke ahụ, ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya bụ iji Akwụkwọ Nsọ gbaa onye ahụ ume ma kasie ya obi. Iji mee nke a, i nwere ike ịtụle akwụkwọ bụ́ Reasoning From the Scriptures peeji nke 117-121 n’okpuru isiokwu bụ́ “Encouragement” (Agbamume). Ma ọ bụkwanụ nye onye ahụ traktị bụ́ Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbȧ n’Obi ma kọwaara ya okwu agbamume ndị dị na ya.

5 Chọọ Ohere Ndị Ị Ga-eji Kasie Ndị Ọzọ Obi: Ọ̀ dị onye agbata obi gị, onye gị na ya na-arụkọ ọrụ, nwa akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ onye ezinụlọ unu ị maara nkasi obi dị mkpa? Gbalịa ịgakwuru ndị dị otú ahụ n’ụlọ ha iji jiri Akwụkwọ Nsọ kasie ha obi. Ebe ọ bụ na ị maara ihe mere nkasi obi ji dị ha mkpa, i nwere ike ibu ya n’uche mgbe ị na-akwadebe ihe ị ga-agwa ha. Ụfọdụ edegarala ndị ahụ akwụkwọ ozi ma ọ bụ kpọọ ha na telefon iji mee nke a. Ezi ịhụnanya anyị nwere maka ndị agbata obi anyị ga-eme ka ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi, kpaliekwa anyị inye ha nkasi obi dị ha mkpa site n’Akwụkwọ Nsọ.—Luk 10:25-37.

6 Ee, e nyere anyị ọrụ ịkasi ndị na-eru újú obi, ime ka ndị nọ ná mwute nwee obi ụtọ, na ime ka ndị mmadụ nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Nke a bụ nkasi obi dị ndị mmadụ mkpa gburugburu ụwa. Anyị iji ọṅụ na-ekwu banyere ezi ihe ndị Chineke kwere anyị ná nkwa ga-akasi ndị nwere obi eziokwu obi ma mee ka ha nwee olileanya. Ka anyị na-echeta mgbe nile na ọ dị mkpa ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya