Jiri Oge I Ji Gaa Ozi Ọma Mee Ihe nke Ọma
1 N’ezie, anyị nwere ọtụtụ ihe ime n’ozi anyị, oge fọdụrụ dịkwa ntakịrị. (Jọn 4:35; 1 Kọr. 7:29) Ọ bụrụ na anyị ana-ahazi onwe anyị nke ọma ma na-ebu ụzọ eme atụmatụ banyere ihe anyị ga-eme, anyị ga-enwe ike iji oge anyị wepụtarala iji jee ozi ọma mee ihe nke ọma.
2 Kwado Akwado: Tupu ị gawa nzukọ maka ozi ubi, hụ na i nwere akwụkwọ ndị ga-adị gị mkpa, burukwa ihe ndị ị ga-ekwu n’ozi ọma n’uche. Ozugbo e jisịrị ekpere mechie nzukọ ahụ, malite ozi. Nke a ga-enyere ma gị ma ndị gị na ha na-arụ aka ịrụpụta ihe kasị ukwuu unu nwere ike ịrụpụta n’ime oge unu nwere iji gaa ozi ọma.
3 Ọ bụrụ na ọ bụ gị ka e kenyere iduzi nzukọ maka ozi ubi, malite n’oge. Ekwela ka nzukọ ahụ gbuo oge—o kwesịghị ịgafe nkeji iri ma ọ bụ iri na ise. Tupu ị sị ndị mmadụ gawa ozi ọma, hụ na onye ọ bụla maara ebe ọ ga-arụ na onye ya na ya ga-arụ.
4 Mgbe Ị Nọ n’Ozi: Ozugbo e mechiri nzukọ maka ozi ubi, egbula oge, kama nke ahụ, gawa ebe unu ga-arụ ozugbo. Mgbe unu na-arụ n’ìgwè, na-echebara ndị ọzọ echiche, bụ́ ndị o nwere ike ịbụ na ha na-eche ka i zichaa ozi ọma. Nke ahụ nwere ike ịchọ ka i jiri akọ kwụsị mkparịta ụka nke gị na onye na-arụ ụka ma ọ bụ ka ị gwa onye nwere mmasị gị na ya na-ekwurịta okwu na ị ga-abịaghachi.—Mat. 10:11.
5 Mgbe ị na-eme nletaghachi, i nwere ike izere ime ogologo njem site n’ịhụcha ndị i nwere n’otu ógbè tupu ị na-aga n’ógbè ọzọ. I nwere ike ịkpọ ụfọdụ ndị na telefon iji jide n’aka na ha ga-anọ n’ụlọ tupu ị gawa.—Ilu 21:5.
6 Anyị bi n’oge oké owuwe ihe ubi ihe atụ. (Mat. 9:37, 38) Ọrụ ahụ ga-agwụ n’oge na-adịghị anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịchọ iji oge anyị ji gaa ozi ọma mee ihe nke ọma.