Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Oct. 1
“Ndị ọkachamara maara mkpa nna dị n’ezinụlọ. Olee ihe i chere na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo nna? [Chere ka ọ zaa.] Jizọs mere nnọọ ka anyị ghọta otú ihe nlereanya nke Nna ya si nyere ya aka. [Gụọ Jọn 5:19.] Isiokwu a kwuru banyere ọrụ isii dị mkpa nna na-arụ.” Gosi ya isiokwu nke malitere na peeji nke 18.
Ụlọ Nche Nov. 1
“Ọtụtụ ndị ekwetaghị na Chineke hụrụ ndị o kere eke n’anya ga-ata ndị mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Olee ihe i chere? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke abụghị onye na-ebu ihe ọjọọ n’obi ma ọ bụkwanụ onye na-emegwara ihe e mere ya. [Gụọ Ezikiel 18:23.] Ihe ndị si n’Akwụkwọ Nsọ a kọwara na magazin a ga-amasị gị.”
Teta! Oct.–Dec.
“Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị mmadụ arụrịtaala ụka banyere ihe ọnwụ bụ. Olee ihe i chere? [Chere ka ọ zaa.] Ka m gosi gị ihe Job chere. [Gụọ Job 14:14, 15.] Isiokwu ndị a ga-agwa gị ihe Baịbụl kwuru banyere mmadụ ịdị ndụ ọzọ mgbe ọ nwụsịrị.”
“Ì chere na ọ bụ uche Chineke ka ụkọ nri a na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala taa dịrị? [Chere ka ọ zaa.] Ka m gosi gị otú o zubere isi gboo mkpa a. [Gụọ Abụ Ọma 72:16.] Isiokwu a kọwara otú Chineke ga-esi weghachi Paradaịs n’ụwa.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 7.